N'Anambra, E Kesàárala Ezinụlọ Ndị Uweojii Nwụrụ Anwụ Ego Nkwàdó

Izunna Okafor dere akụkọ a
Onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP Echeng Echeng nọrọ ụbọchị Tuzdee wee kesàárá ụfọdụ ndị mmadụ, bụ ndị ezinụlọ iri na ise ndị ọrụ uweojii nwụrụ n'ọrụ uweojii n'ime steeti ahụ akwụkwọ ndọrọ ego nkwàdo mgbàkọta ya ruru nde naịra iteghete na otu narị puku naịra (₦9.1million).
Ego ahụ bụ nke CP Echeng kesàrà nye ndị ahụ n'aha onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Akali Baba Usman, ma bụrụkwa nke e mere n'okpuru atụmatụ ‘Inspector-General of Police Family Welfare Insurance Scheme’, nke ebumnobi ya bụ iji kwàlite ezi ọnọdụ obibindụ ezinụlọ ndị uweojii ahụ nwụrụ n'ọrụ site n'inyere ha aka.
Atụmatụ ahụ bụkwa nke na-enye aka ịkwalite mmụọ na ọnụnụọkụnobi ndị uweojii ka ha na-arụsi ọrụ ike, burukwa n'obi na ụlọọrụ uweojii bu ọdịmma ha na ndị ezinụlọ ha n'obi.
Ka ọ na-ekesara ndị ahụ akwụkwọ ndọrọ ego ahụ, CP Kuryas kèlèrè onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman, maka ezi agbambọ ya n'ịkwàlìtè ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ uweojii na ndị ezinụlọ ha. Ọ dụkwàzịrị ndị ahụ o kesaara ego ahụ ọdụ ka ha tinye ya n'ihe ga-abara ha uru ma ritekwara uru ha ga-eji zụọ ụmụ ha, karịa ịga mefusie ya n'ihe abaghị uru.
O kwukwazịrị na ha bụ ndị uweojii na steeti ahụ ga-aga n'ihu ịrụsi ọrụ ha ike iji weta udo na ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ na steeti ahụ, nà n'ala Nigeria n'izugbe.
O mekwara ka a mara na akwụkwọ ndọrọ ego ahụ bụ nke ha na-enweta nà mgbe nà mgbe site n'aka IGP Usman, ma bụrụkwa nke o kesààrà ndị ritere uru na ya. O mèkwàrà ka o doo anya na ọ bụ ezinụlọ ndị uweojii ruru iri na ise n'ọnụọgụgụ, ndị nwụrụ n'ọrụ na steeti ahụ ka e kesààrà ego nke a.
N'okwu ha n'otu n'otu, ndị dị icheiche soro kete ago ahụ kèlèrè IGP Akali na CP Echeng maka ya bụ ego nkwàdo, ma kwe nkwa itinye ya n'ihe bara uru, jirikwa ya mepụta ihe a hụrụ anya, ma kwàdókwa ezinụlọ ha dị icheiche.
What's Your Reaction?






