N'Anambra, e jidela agadi nwoke tụbara nwatakịrị bi n'ụlọ ya ime

Jan 30, 2023 - 14:42
 0
N'Anambra, e jidela agadi nwoke tụbara nwatakịrị bi n'ụlọ ya ime

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụrụ na a gụghị ebule amụ, ọ gaghị akwụsị ịkụ mgbịrịgba aga iro ogologo.

Ka ọ dị taa, a nwụchiela otu agadi nwoke gbara afo iri asaa na atọ maka ịtụba nwata nwaanyị gbara naanị afọ iri na atọ ime n'Anambra.

Nwoke ahụ, bụ Maazị Sunday Muoghalu ka e kwuru na nwatakịrị nwaanyị ahụ bi be ya dịka otu n'ime ndị na-ejere ya ozi n'ụlọ be ya dị na mpaghara Agu-Oye-Umudioka, dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze, bụ Oriakụ Ify Obinabo zọpụtàrà nwatakịrị nwaanyị ahụ n'ụlọ ahụike ‘St. Benedict Hospital, Adazi-Nnukwu’ oge ọ gara njem nleta n'ebe ahụ. Ọ kpọrọzịkwara ya bụ nwatakịrị nwaanyị wee gaa ebe a ga-anọ lekọta ya na nwa ya anya nke ọma.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Kọmishọna Obinabo gbarụ̀rụ̀ ihu banyere ụdị arụrụala dị etu ahụ, ma katọ̀ọ́ ya kpamkpam dịka nke jọgburu onwe ya. O kèlèrè ndị dị icheiche nyere aka wee tinye ma gbasaa ozi banyere ihe ahụ n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, o wee ruo ya na ndị ọrụ nchekwa ntị; ha wee nwụchikọọ ya bụ nwoke.

Dịka ọ na-adọ mmadụ aka na ntị banyere ụdị ndị ha na-akpọnye ụmụ ha; Oriakụ Obinabo mèrè ka a mara na a ga-akpụpụ̀ nwoke ahụ ụlọikpe, ma kwe nkwà na ya bụ nwata nwaanyị ga-enweterịrị ikpe nkwụmọtọ.

Ka a na-agba ya ajụjụọnụ, nwata nwaanyị ahụ a tụbara ime, onye ku obere nwa ọnwa abụọ n'aka, kwùrù na ọ bụghị naanị ya ka nwoke ahụ tụbagoro ime, n'ihi na e nwèkwàrà nwata nwaanyị ọzọ gbara naanị afọ asaa nwoke ahụ tụbakwara ime.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọ bụ oge nwunye nwoke ahụ, bụ onye a maara dịka Madam Ghana mere njem ebe dị anya, ka nwoke ahụ mere ihe ahụ. Ọ sịkwa na ya enyebụọla nwunye nwoke ahụ mkpesa banyere ihe ahụ di ya na-eme; bụkwazị nke mere ka ọ dọọ di ya aka na ntị megide ụdị arụrụala ahụ.

Ya bụ nwatakịrị nwaanyị, onye si steeti Akwa-Ibom ka e kwuru na nna ya bu n'Agulu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anaocha, ebe e zigazị̀rị̀ ya bụ nwata ka ọ gaa biri be nwoke, tupu ihe ahụ wee mee, nke mezịrị ka nne ya ukwu kpọlaara ya nna ya ebe o bi.

N'okwu ya oge a na-agba ya ajụjụọnụ, nwoke ahụ rụrụ arụrụala ahụ, bu Maazị Muoghalu kwùrù na ọ bụ eziokwu na ọ bụ ya tụbara nwata ahụ ime, ma kwuo na ebumnobi ya abụghị ịtụba ya ime, kama na ọ bụ mkparịamụ ka ya na ya na-enwe, tupu mkpọ ya wee kwụrụzie ọtọ, nke na o nweghịzị ike ijide onwe ya; o wee rie ya ọ̀kọ̀mbọ̀, bụzị nke mere o jiri dị ime.

13/12/22

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484