N'Abia, Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ahụ Gburu Nwaagbọghọ n'Ime Ụlọ Nkwariakụ, Tọrọ Nwa Ya

N'Abia, Ndị Uweojii Ejidela Ndị Ahụ Gburu Nwaagbọghọ n'Ime Ụlọ Nkwariakụ, Tọrọ Nwa Ya

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Abia ejidela ụmụokorobịa abụọ a na-enyo enyo na aka ha dị n'ogbugbu ahụ e gburu otu nwata nwaagbọghọ gbara ahọ iri abụọ na otu n'ime otu ụlọ nkwariakụ na nsonso a, bụ onye mụrụ nwa ọhụrụ ọ na-enye ara.

Akụkọ kọrọ na oge ndị ahụ gbuchara nwaagbọghọ ahụ, na ha tọrọkwara nwakịrị ahụ ọ mụrụ ọhụrụ, bụ onye dị naanị ọnwa iri na otu, wee ga ree ya narị otu puku naịra na iri ise (N150,000).

Nwaagbọghọ ahụ aha ya bụ Chihurumnaya Udeh, ka e kwuru na ọ bụ onye Edda dị na steeti Ebonyi, ma biri na mpaghara Ụmụnkama dị n'ụzọ Ngwa n'Aba nke steeti Abịa; mana ụmụokorobịa abụọ ahụ ghọgburu ma duru ya gaa n'otu ụlọ nkwariakụ dị na mpaghara Ogbor Hill, bụ ebe ha nọrọ memilaa ya.
 
N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ oge a na-akpụgharị mmadụ abụọ ahụ n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ụmụahịa, onyeisi ndị uweojii na steeti Abịa, bụ CP CP Janet Agbede kwuru na ọ bụ n'abalị iri na ise nke ọnwa Epure ahọ a ka ya bụ ihe mere, ma mekwa ka a mara na ọ bụ n'ụlọ nkwariakụ ‘Merry Home Hotels’ ka ọ nọrọ wee mee.

Dịka o siri kwuo, ụmụnwoke abụọ ahụ kpara ya bụ arụ, bụ Chimaobi Anyim Kalu (gbara ahọ iri abụọ na ise) na David Ogwo Orji (gbara ahọ iri abụọ na otu) gbara izu wee jiri karama sụgbuo nwaagbọghọ ahụ, ma kpọrọ nwa ọhụrụ ya ahụ bụ nwatakịrị nwoke wee pụọ, ga ree ya. 

Ọ gakwara n'ihu kwuo na oge onye nwe ụlọ nkwariakụ ahụ chọpụtara ihe mere, na ọ gara ozigbo wee nye mkpesa n'aka ndị uweojii banyere nke ahụ, bụzị nke mere ka ha banye n'ọrụ ozigbo ime nnyocha banyere ya bụ ihe.

O kwukwazịrị na ọ bụ site na nnyocha ha mere ka ha siri chọpụta aha nwaagbọghọ ahụ, ebe o si, nà aha nwa ya nwoke ahụ ndị ahụ tọọrọ pụọ, bụ Chimereobioma Silver.

Kọmishọna ahụ mekwazịrị ka a mara na ha megidere nnyocha, wee mechaa nwụchie ndị arụrụala abụọ ahụ n'abalị iri na ise na abalị iri na isii nke ọnwa Mee ahọ a, bụkwa ndị e mechaara chọpụta na ha abụọ bụ ndị Ọkada, ma bụrụkwa ụmụafọ obodo Ugwueke dị n'okpuruọchịchị ime obodo Bende, nke steeti Abia.

O kwuru na ha ka na-eme nnyocha iji nwụchie ndị ọzọ aka ha dị n'arụrụala ahụ, na onye ndị ahụ resiri nwata ahụ, ka ha wee napụta ya bụ nwa.

Ọ sị na ndị ahụ ejirila ọnụ ha kwuo eziokwu na ọ bụ ha mere ya bụ ihe, ma kọwakwa na ọ bụ otu nwoke, bụ Maazị Chukwuemeka James dunyere ha gaa gbuo nwatanwaanyị ahụ ma tọrọ nwa ya.

Dịka o siri kwuo, ndị ahụ gbara ama na ha buru ụzọ mesasịa nwa agbọghọ ahụ anya site n'inye ya ọgwụ ike ‘piriton’, bụ nke ha tinyere n'ihe ọñụñụ Yoghurt wee nye ya ka ọ ñụọ, ma bụrụkwazie nke ọ ñụchaara wee daa, tupu ha wee jiri mpempe iko karama (broken glass cup) wee bepuo ya olu ma sụgbuo ya ebe ahụ ozigbo, kpọrọ nwa ya pụọ.

Ha kwukwara na oge ha gbuchara ya, na ha kpọọrọ nwa ya ahụ wee nyefee n'aka otu nwaanyị na-atụ mgbere nwa (onye na-ere ma na-ego ụmụaka), dịka James ahụ sikwara nye ha ntụziaka.

Ndị ahụ kọwakwara na ha amaghị nwaanyị ahụ ha kpọnyere nwa ahụ, rukwaa taa, n'ihi na ọ bụ ihe James gwara ha ka ha mere. Ha sịkwazị na ka ha ka ha mechara ihe niile ahụ,  na James n'onwe ya nyekwazịrị ha ego dị otu narị puku naịra na iri ise (N150,000), bụkwa nke ha abụọ kere, wee kete ya puku naịra iri asaa na ise.