Na Sokoto, E Jidela Mmadụ Isii Gburu Nwoke Ahọ Iri Iteghete, Gbaa Ozu Ya Ọkụ

Na Sokoto, E Jidela Mmadụ Isii Gburu Nwoke Ahọ Iri Iteghete, Gbaa Ozu Ya Ọkụ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka ndị uweojii na steeti Sokoto akparala mmadụ isii a na-enyo enyo na ha bụ ndị ohi, ma bụrụkwa ndị na-etinye aka n'ụdị mpụ na arụrụala dị icheiche na steeti ahụ.

Mmadụ isii ahụ bụkwa ndị a na-enyo na ha bụ ndị òtù ọrụ nchekwa obodo a maara dịka Yan Sakaị, bụ òtù ọrụ nchekwa a machiri amachi na steeti ahụ.

Dịka akụkọ siri kọọ, ndị ahụ nọrọ na nsonso a wee jide otu nwoke gbara ahọ iri iteghete, gbuo ya, ma gbaa ozu ya ọkụ n'obodo Zangon Atti dị n'okpuruọchịchị ime obodo Gwadabawa nke steeti ahụ.

Nwoke ahụ, bụ Muhammad Riskuwa ka e kwuru na ndị omekome ahụ zutere ya na nwa ya nwoke, bụ Shehu Mamman oge ya na ha nwechara mkparịtaụka na be ya, otu onye n'ime ha wee jiri egbe gbagbuo ya ozigbo, ebe nwa ya nwoke zọtakwara isi onwe ya ma gbafuo.

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Sokoto, bụ Maazị Sanusi Abubakar siri kwuo, aka ndị uweojii mechaara kpàrá ndị ahụ oge e nwetere ozi banyere ihe ha mere.

Ọ sị na ndị ahụ ejirikwala ọnụ ha wee sàá asịsà na ha mere ya bụ ihe n'eziokwu; ma kọwakwarị na ha waghasịrị ime ụlọ be nwoke ahụ, ma zuru ego dị narị puku naịra anọ na iri atọ (N430,000.00), bụ ego nwoke ahụ; bụkwa nke ha zuuru pụọ oge ha mụnyèchara ozu ya ọkụ.

Maazị Abubakar mekwàrà ka a mara na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha banyere ihe ha mere.