Na Lagos, Ọkụ Ọgbụgba Adapụtala n'Ahịa Balogun

Na Lagos, Ọkụ Ọgbụgba Adapụtala n'Ahịa Balogun

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọkụ ọgbụgba dapụtara na Lagos agbarikọọla ụfọdụ ọdụ ahịa na ngwaahịa dị n'ahịa a maara dịka Balogun na mpaghara Lagos Island.

Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke dapụtara na nnukwu ahịa ahụ ụbọchị ụka gara aga, ma bụrụkwa nke e kwuru na ụmụokorobịa nọ ebe ahụ gbara mbọ ole ike kwere ha iji gbanyụọ ya, tupu ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti Lagos, ndị ọrụ nsọnyụọkụ gọọmenti etiti, na ndị ọrụ nsọnyụọkụ ụlọ ọba ego UBA erute n'ebe ahụ, o wee nwuru bàá n'ebe a dọbara otu nnukwu igwe ọkụ Mikano Generator, nke bụ ọkụ wee malite.

Akụkọ kọrọ na e mechàzìèrè gbanyụọ ya bụ ọkụ, site n'enyemaka ndị ọrụ nsọnyụọkụ ahụ na ndị mmadụ ndị ọzọ nyekwara aka n'ụzọ dị icheiche, nke mezịrị na ya bụ ọkụ emebighị̀ ọtụtụ ihe maọbụ nwubaa n'ọtụtụ ọdụ ahịa n'ebe ahụ.

Kaosiladị, a chọpụtabeghị ihe ọ bụ ya kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.