Mmanwụ ekpoo elu dịka onyeisi ASATU riri ji ọhụrụ ahọ 2022

Oct 4, 2022 - 04:17
 0
Mmanwụ ekpoo elu dịka onyeisi ASATU riri ji ọhụrụ ahọ 2022

Izunna Okafor dere akụkọ a

A kọwaala mmemme iri ji ọhụrụ dịka otu n'ime omenala pụrụ iche e jiri mara ndị Igbo, nà omenala ha mebere kemgbe mgbe gboo.

Onyeisi òtù jikọtara ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dị n'Anambra, bụ ‘Anambra State Association of Town Union (ASATU)’ Maazị Titus Akpudo bụ ya kwupụtara nke a na mmemme iri ji ọhụrụ nke ahọ 2022 o mere be ya n'obodo ya bụ Eziowelle, n'okpuruọchịchị ime obodo Idemili North nke steeti Anambra.

Maazị Akpudo, onye bụkwa onyeisi ọchịchị obodo (PG) Eziowelle merùbèrè ya bụ emume iri ji ọhụrụ oge eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Okonkwo Etusi mèchàrà omenala Ịwa Ji obodo ahụ.

Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ Eziowelle, ndịisi ọchịchị obodo dị icheiche dịgasị n'Anambra, ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ sitere ebe dị icheiche wee bịa
 
N'okwu ya na mmemme ahụ, Maazị Akpudo, onye eze ọdịnala obodo ahụ chiri echichi na nsonso a dịka “Ugwu Nyịrị Onye Ọsọ” mèrè ka a mara na mmemme iri ji ọhụrụ bụ nnukwu mmemme n'ala Igbo, ma bụrụkwa mmemme e ji akwanyere ji ùgwù dịka eze ihe a kọrọ n'ugbo, dịka omenala Igbo siri dị.

O kwuru na ọ bụ nke adabàghị adaba chaachaa, bụ echiche ahụ ụfọdụ ndị mmadụ na-eche na ihe ụfọdụ na-ekwu oge ụfọdụ na iri ji ọhụrụ bụ ihe ikpere arụsị maọbụ ihe ọgọ mmụọ, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị na-eche ụdị echiche dị etu ahụ ka ha kwụsị ya, n'ihi na o nweghị ihe ọbụla jikọọrọ iri ji ọhụrụ na ikpere arụsị, maọbụ nwee ka ha abụọ si bụrụ otu ihe.

O kelere Chineke maka ichekwaba na idu ya na ụmụafọ obodo ahụ n'ogologo oge niile nke ọrụ ugbo, ha wee kọọ, ma dịkwa ndụ wetekwa ihe ubi n'uju. O tòkwàrà Chukwu maka nchekwa Ya na ngọzị Ya n'isi obodo ahụ na ụmụafọ ya, ha wee na-apụ, na-abata, ma na-agawanye n'ihu, na-emekwa nke ọma n'ihe dị icheiche ha na-eme.

Ya bụ mmemme kpògharazịrị ọkụ n'ozuzuoke, dịka a malitezịrị ịgba egwu na ime ihe ngosi ndị ọzọ dị icheiche site n'aka ndị òtù egwu ọdịnala icheiche pụtara ọgbọ ụbọchị ahụ. 

A nọkwazịrị na mmemme ahụ tie mmanwụ, gbaa egwu ọdịnala ma mekwa ihe ngosi dị icheiche. A nọ̀kwàrà na ya kpaa ma kpee ekpere maka ọdịmma obodo ahụ; rie erimeri dị icheiche, ọkachasị ji ọhụrụ a hụrụ ahụ, nke e jiri mmanụ akwụ ọhụrụ, ụkpaka na ụtazị mara abụba wee hazie, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi e jiri wee gbanyere ya ụgbọ nwamkpi; nke mezịrị ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya n'ezie.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484