Mbazulike Amechi: Oke Osisi Adaala

Nov 7, 2022 - 03:43
 0
Mbazulike Amechi: Oke Osisi Adaala

Izunna Okafor dere edemede a

Ọ na-abụ ụ̀zụ̀ tụọ n'ilì dike, ọha mmụọ na ọha mmadụ anụ ísì ozu ya, maka na nkụ a gwọọrọ ajụ abụghịzị obere nkụ. Ọ na-abụkwa ihe emeghị n'izu, o mee n'ọnwa, maka na ụkwa mịrị àmị̀ ga-adàrịrị àdà.

Ka ọ dị taa, otu nwaafọ Igbo ji eme ọnụ ma bụrụkwa agụ nwoke e ji okwu ya agba izu n'ọchịchị obodo, bụ Dara Mbazulike Iwuchukwu Amechi adaala n'ụra ọnwụ ma gaba obodo afụdobe.

Ya bụ odogwu, onye e jikwa “Dara Akụnwafor” wee mara bụ onye malitere njem ikpeazụ ya n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee, abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2022. Ọ nwụrụ na be ya dị n'Ukpor, n'okpuruọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye gbara afọ iri iteghete na atọ wee laa mmụọ. A mụrụ ya n'abalị iri na isii nke ọnwa Juunu afọ 1929, ma zulitekwa ya site n'aka nne na nna ya bụ  Iwuchukwu Dara Amechi Ndumka na Omenwa (Ihezie) Ndumka.

Tupu ọnwụ ya, Dara Amechi bụ naanị onye fọrọ n'ime ndị soro wee ‘lụọ ọgụ’ site n'okpuru òtù a maara dịka “Zikist Movement” nke Maazị Nnamdi Azikiwe hibere, iji mee ka ala Nigeria nwere onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha, bụkwazị nke mechaara bịa na mmezu n'abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba, afọ 1960.

Ka Nigeria nwerechara onwe ya pụọ n'aka ọchịchị ndị ọcha, ọ bụ Mbazulike Amechi bụ nwaafọ ala Nigeria mbụ jiri ọkwa dịka Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ n'ala Nigeria, ma bụrụkwa onye jiri ọtụtụ ọkwa ndị ọzọ dị icheiche n'ogoogo dị icheiche.

Malite n'oge ahụ ala Nigeria nweere onwe ya nà tupu oge ahụ, Amechi so n'otu oké osisi ndị Igbo jiri kwụrụ, ma bụrụkwa onye na-etinye ọnụ nke ukwuu ma na-emekwa ntụnye pụrụ n'okwu gbasara ọnọdụ ala Nigeria na ọchịchị obodo.

O bụkwa ya duru ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'ala Igbo wee gaa kpọtụrụ Onyeisiala Nigeria, Muhammadu Buhari n'ọnwa Nọvemba afọ gara aga, bụkwa ebe ọ nọrọ rịọ ya ka ọ hapụrụ ya Maazị Nnamdị Kanu, bụ onyeisi otu ‘Indigenous People of Biafra (IPoB)’ bụ ndị na-achọ nwereonwe Biafra, onye a kpọchiri n'ụlọ mkpọrọ kemgbe ọnwa Juunu afọ 2021.

Kaosiladị, Onyeisiala Muhammadu Buhari jụrụ ya bụ arịrịọ sị na ọ chọrọ ịhapụ ya bụ okwu ka ụlọikpe kpezie ya. Ka ọ dị taa, ya bụ Onyeisiala atọhàpụ̀ghị Maazị Nnamdi Kanu, wee rukwaa taa, bụkwa nke pụtara na o meghị ihe ahụ Mbazulike Amechi rịọrọ ya wee rukwaa n'ọnwụ ya.

Ọnwụ Mbazulike Amechi bụ̀ nke e kwupụtàrà ụbọchị Tuzdee site n'Akwụkwọ ozi si n'aka nwa ya nwoke bụ Ezeana Tagbo Amechi (n'aha ezinụlọ ya), onye rịọkwara ka ndị mmadụ tinye ha n'ekpere n'ihi ihe iru uju ahụ dakwasị̀rị̀ ha.

Dịka otu onye achọghị ka a kpọọ aha ya siri kọwaa, Amechi malitere ịrịa nwa obere ọrịa kemgbe Tọzdee, abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa Ọktoba afọ a. 

Onye ahụ kọ̀wàkwàrà na a wara Amechi àhụ́ n'ihi ya bụ ọrịa, mana o mèchààrà nwụọ dịka ọ na-achọ ịgbakere n'àkwà ọrịa ahụ.

Ka ọ dị taa, ọtụtụ ndị Igbo ọnụ na-eru n'okwu akwaala arịrị maka ọnwụ odogwu Igbo bụ Mbazulike Amechi lara mmụọ n'oge a chọrọ ya nke ọma n'ala Nigeria.

N'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ site n'aka odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Christian Aburime; aka na-achị Steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kwuru na ọnwụ Mbazulike Amechi emetụtaghị naanị obodo ya bụ Ukpor, kama na ọ bụ nnukwu ihe funahụrụ ndị Igbo niile, obodo Nigeria, nakwa Africa n'izugbe.

Na nkọwa ya banyere odogwu nwoke ahụ, Gọvanọ Soludo kwùrù na nwa amadi ahụ bụ onye nwere nnukwu mmasị maka ọdịmma obodo ya, bụrụkwa olu na-adasị ụda ike n'otu 'Zikist Movement'; ọbụna dịka o kpere ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa.

N'akụkụ nke ya, aka chịburu steeti Anambra ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị Labour Party apụta izọ ọkwa Onyeisiala Nigeria n'afọ 2023 bụ Maazị Peter Obi kọwara Ichie Amaechi dịka mmadụ nwere nkwuwaokwu, na-anaghị ele mmadụ anya n'ihu n'ikwu eziokwu.

N'ihe o depụtara n'akara Twitter ya maka ọnwụ Amechi, Obi sị "Mbọ niile ọ gbara maka mwulite obodo Nigeria abụghị ihe a ga-echefu echefu.

"Ọ bụ onye jiri ndụ ya lụọ ọgụ maka ịdịnotu na ọganihu nke obodo Nigeria. Ka mkpụrụobi ya zuo ike n'udo."

Maazị Mbazulike Amechi lụrụ nwunye ya bụ Ịyọm Chinelo Amechi (lagoro mmụọ) n'abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Disemba afọ 1960; mana ya bụ agụ nwaanyị mèchàrà nwụọ n'abalị n'ọnwa Julaị afọ 2021 ka ọ gbachara afọ iri iteghete na otu.

Ọ dị ncheta na ọ bụ Mbazulike Amechi bụ naanị nwaafọ ala Nigeria kwuru ma kpebie na ọ gaghị alụ nwaanyị, wee rukwaa mgbe ala Nigeria nwetere nwereonwe n'aka ọchịchị ndị ọcha, bụkwa nke o mezuru, n'ihi na ọ lụghị nwaanyị wee ruo n'ọnwa Disemba afọ ahụ Nigeria nwerechara onwe ya, bụ afọ 1960.

Ha abụọ mụ̀tàrà ụmụ ise, nke gụnyere Ikenna Amechi, Victor Amechi, Ncheta Amechi, Raphael Amechi, na Tagbo Amechi, tinyere ọtụtụ ụmụ-ụmụ Chineke jiri gọzie ha.

N'ezie, ọnwụ Mbazulike Amechi bụ ọdịda oke osisi, bụkwa oke osisi ụwa niile na-ahụta ịdị ukwuu ya na ebube ya mgbe ọ dị ndụ, ma bụrụkwa nke a nụrụ ụda ya na mpaghara ụwa gbaa gburugburu mgbe ọ dara; maka na ọ na-abụ ụ̀zụ̀ tụọ n'ilì dike, ọha mmụọ na ọha mmadụ anụ ísì ozu ya.

Pa Amechi, ka mkpụrụobi gị achọghị nsogbu zuo ike na ndokwa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484