Ka Ọkụ Siri Gbapị̀a Ọdụ Ahịa Karịrị 80 n'Onitsha Ụbọchị Tuzdee

Izunna Okafor dere akụkọ a
Anyammiri gbara ka iju ụbọchị Tuzdee, dịka ajọ ọkụ ọgbụgba dapụtara ma gbapịa ọtụtụ ihe na mpaghara ahịa Ọgbọ Ọgwụ dị n'Onitsha, n'ime steeti Anambra.
Ya bụ ọkụ ọgbụgba bụ nke bidoro n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee ma bụrụkwa nke gbara ọtụtụ awa, gbarikọọ ọtụtụ ngwaahịa, gbuo ufọdụ mmadụ, ma merụsịkwa ọtụtụ mmadụ ahụ, tupu a gbanyụọ ya.
Dịka onyeisi ụlọọrụ nsọnyụọkụ steeti Anambra bụ Injinia Martin Agbili siri kọwaa, ajọ ọdachi ahụ bụ nke malitere n'ihi oké ihe mbigbọ (explosion) dapụtara na mpaghara ebe a maara dịka “Science and Lab Line” nke Ahịa Ọgbọ Ọgwụ, bụkwazị nke manyara ma kwatuo ọtụtụ ụlọahịa dịgasị n'ebe ahụ, wee binwuruzie ọkụ n'ọdụ ahịa dịgasị na mpaghara ahụ.
O kwuru na ọ bụ oge o jiri ọkara gata elekere iri na abụọ nke ehihie ka o nwetere ozi banyere ya bụ ọkụ ọgbụgba; o wee zipu ndị ọrụ ya ozigbo, ha wee buru ụgbọala nsọnyụọkụ, gaba ebe ahụ. Ọ sịkwazị̀ na ọ bụ ndị ọrụ nsọnyụọkụ steeti ahụ na ndị ọrụ nsọnyụọkụ gọọmenti etiti nọ na steeti ahụ jikọrọ aka ọnụ wee buso ọkụ ahụ agha, ma megide gbanyụọ ya.
Injinia Agbili gara n'ihu mee ka a mara na ya bụ ọkụ gbarikọ̀rọ̀ ọdụ ahịa ruru iri asatọ n'ọnụọgụgụ; ebe a mabeghị̀kwà ọnụọgụgụ mmadụ ole nwụrụ n'ebe ahụ na ndị nke merụrụ ahụ.
O kwukwàrà na Osote Gọvanọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim bịara ebe ahụ ya bụ ọdachi dapụtara, ya na Kọmishọna na-ahụ maka ọkụ na mmiri, bụ Injinia Julius Ezenwanne, na ụfọdụ Kọmishọna ndị ọzọ, iji anya ha hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ebe ahụ, na imetere ndị ajọ ọdachi ahụ metụtara ebere na inyere ha aka.
Dịka ọ na-eme ka a mara na ha tinyesiri atụmatụ ga-enye aka ichekwa mpaghara ahịa ahụ niile na gburugburu ya; Injinia Agbili kọwàkwàrà na ọ bụ n'ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ime abalị ka ha jiri hapụ ebe ahụ ya bụ ihe mere, wee Onitsha laba Awka. Kaosiladị, ọ sịkwa na ndị ọrụ ya na ụgbọala nsọnyụọkụ ha nọrọ ebe ahụ wee ruo n'echi ya, iji hụ na e nweghị ajọ ọdachi ọzọ dị etu ahụ dapụta n'ebe ahụ.
Ọ dọ̀kwàzị̀rị̀ ndị mmadụ aka na ntị ka ha na-akpachapụ anya ma zeere ihe ọbụla nwere ike ibute ọkụ ọgbụgba, ọkachasị ugbua a na-abanye n'oge ụgụrụ kpọmkwem, bụkwa oge ihe ji akpọsị nkụ.
What's Your Reaction?






