Ka Gọvanọ Soludo siri ziga amụma ego ọrụ afọ 2023 n'ụlọ omeiwu Anambra

Dec 1, 2022 - 07:13
 0
Ka Gọvanọ Soludo siri ziga amụma ego ọrụ afọ 2023 n'ụlọ omeiwu Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra Gọvanọ Willie Obianọ enyefèéla amụmà ego ọrụ ahọ na-abịa abịa, bụ ahọ 2023 n'aka ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ maka inyòchà, ilebà ya anya na ime ihe ndị ọzọ e kwesiri ime iji nabàta ma bìnye aka na ya.

Ya bụ amụma ego ọrụ bụ nke mgbakọta ya ruru narị ijeri naịra abụọ na iri isii (₦260bn), ma bụrụkwa nke ya bụ Gọvanọ zigara n'ụlọ omeiwu ahụ ụbọchị Tọzdee.

N'ime amụma ego ọrụ ahụ, otu narị ijeri naịra na iri atọ (₦130bn) bụ maka ọrụ mmepe dị icheiche; ebe ijeri naịra iri iteghete na ise na ụma ise bụ maka ịkwụ ụgwọ na ihe ndị ọzọ a na-eme na mgbe na mgbe. 

N'okwu ya oge ọ na-edobe ya bụ amụma ego ọrụ n'ihu ndị omeiwu ahụ, Gọvanọ Soludo kọwàrà ya dịka amụma ego ọrụ ịgawanye n'ihu, iji hụ na ya bụ steeti na-agawanye n'ihu n'agbànyeghị ihe iche aka mgba dị icheiche.

Ọ gara n'ihu nye nkọwa banyere etu ya bụ ego siri gaa na ngalaba dị icheiche, na ihe a ga-ejigasị ha mee na ngalaba ahụ; ma kọwakwa na a makwàsàrà ego n'elu ego ole a mapụtabụ̀rụ̀ maka ngalaba dị icheiche; ma kọwakwa na ebumnobi nke ahụ bụ n'ihi etu ihe siri gbata kwụrụ ugbua nàkwà ihe ọchịchị ya na-ezùbe maka ngalaba ahụ.

O kwuru na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike imezupute nkwà dị icheiche o kwere, ma na-emezupụta amụmà ego ọrụ steeti ahụ, n'agbanyeghị etu ọnọdụ akụnụba ala Nigeria siri debe imi na ọnụ. O kelekwazịrị ndị omeiwu steeti ahụ maka nkwàdo ha na-enye ya site n'etu ha si arụkọ ọrụ ọnụ kemgbe ọnwa olenole gara aga o jiri banye n'ọkwa; ọbụladị dịka ọ rịọrọ ha ka ha mee nnyocha ma binye aka n'amụmà ego ọrụ ahụ ngwangwa dịka a tụrụ anya, n'ihi na amụma ego ọrụ ahụ ga-enye aka n'imezupụta atụmatụ ọrụ mmepe dị icheiche ọchịchị ya ji n'aka na steeti ahụ.

Na nzaghachi ya n'aha ndị omeiwu ahụ, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uche Okafor kwuru na Gọvanọ Soludo kwùrù na ha bụ ndị omeiwu ga-enyòcha ma lebà anya amụmà ego ọrụ ahụ nke ọma, jide n'aka na ọ dabara adaba n'ihe ụmụafọ Anambra chọrọ, ma binyekwa ya aka ma ha lebàchaa ya anya.

Mmemme inyefè amụmà ego ọrụ ahụ bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọ omeiwu steeti ahụ dị n'Awka, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndịisi ụlọọrụ gọọmenti dị icheiche na steeti ahụ, ndị eze ọdịnala, na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche na steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484