M Gà-Aga n'Ihu n'Iwètara Ndị Be Anyị Ezi Nnọchi Anya -- Umeh...
Nwa amadi ahụ na-anọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n'ụlọ ọgbakọ sineeti ala anyị, bụ maazị Victor Umeh ekwunwòóla njìkere ya ịga n'ihu n'inye ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ na ụmụafọ Igbo niile ezi nnọchi anya, iji hụ na okè ha efughị cháá cháá.
|
Ndị Fada Nọ n'Ime-Ime Obodo Nwere Ike Ịlụ Nwaanyị -- Pope Francis...
Dịka a sị na ọnọdụ dịba àñaa, e nyebere onye nke ya kacha njọ aka, onyeisi ụka Katọliiki n'ụwa gbaa gburugburu, bụ 'Pope' Francis emeela ka a mara na Ụkọchukwu Oseburụwa (Fada) ndị nọ n'ime-ime obodo nwezịrị ike ịlụ nwaanyị n'ọnọdọ dị añaa, iji nyere ndụ ha na ọrụ ha aka.
|
Adị M Nnọ Ka Akpa Amụ Ebule -- Dino Melaye...
Dịka a sị na ọ na-abụ mmadụ lechaa ndụ ya anya, o were aka ya nye onwe ya aha, otu nwa amadi ahụ a na-anụ aha ya anụ n'igwù n'okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị n'ala Nigeria, ma bụrụkwa onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo mpaghara Ọdịda Kogi (Kogi,West) n'ụlọ ọgbakọ Sineeti ala anyị, bụ maazị Dino Melaye ekwuola na ya dị nnọọ ka akpa amụ ebule (oke atụrụ), dịka o lechaara anya n'ihe megoro na ndụ ya nsó-nsó a.
|
Ụlọ Omebe Iwu Anambra Azọpụ Ụkwụ Igbòchi Oke Ọnwụ Na-Esite N'Ihe Mberede Okporo Ụzọ...
Dịka a sị na owètara ihe na-azọ ndụ azọọlarị ndụ azọọ, ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra azọpụla ụkwụ dike igbochi oke ọnwụ ekwesighị ekwesi a na-anwụ n'ihi n'ihe mberede okporo ụzọ, site n'iwepute atụmatụ iwu ga-ahụ na onye ọbụla na-akwọ ụgbọala na steeti ahụ ga-enwerịrị akụrụngwa e ji enye ọgwụgwọ mbụ tupu e buru ya gaba ụlọ ọgwụ, bụ 'First Aid Kits' n'ime ụgbọala ya oge niile ma burukwa ya na-aga ebe ọbụla ọ na-aga.
|
A Dụọla Ndị Na-Achị Ehi n'Okpuru Ọchịchị Anambra East na West Ka Ha Kwápụ...
Dịka a sị na mbịara mbịara emeghị ka mbịara mbịara, di bi ụlọ emee ka di bi ụlọ, e nyela ndị niile na-achị ehi n'obodo dị iche iche dị n'okpuru ọchịchị Abambra 'East' na Anambra 'West' iwu ka chịkọrọ ehi ha pụọ na mpaghara ahụ ozigbo ozigbo.
|
E Jidela Ndị Ọrụ INEC Adịgboloja Na-Egwù Ndị Mmadụ Wàyo...
Dịka a sị na ịkpọ ngwere emeghn ihe o jiri bụrụ ịkpọ ngwere, ụmụaka ewere ya mere nri n'udu mmiri na ọkọchị; aka akpàrala mmadụ atọ bụ ndị adịgboloja na-ebugharị onwe ha dịka ndị na-arụ n'ụlọ ọrụ Independent National Electoral Commission, bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n'ala anyị.
|