Ndị NDLEA Anwụchikọọla Mmadụ Iri Asatọ n'Anambra Maka Ọgwụ Ike...

Dịka a sị na a gbaghị Ụzọ oweri mgba ọ naghị echi, ụlọ ọrụ ahụ na-ebu agha megide ịkpọ, ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, ngalaba ya nke steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa mmadụ iri na asatọ, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'ọgwụ ike Cannabis Sativa.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Nturu Ugo APGA Ga Akwalite Ezi Ọchịchị Na Ebumnobi Ndị Igbo --- Obianọ

Aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ ekwuona na ọ dị mkpa ka otu pati APGA turu ugo na nhọpụta ahụ na-abịa n'ihu na steeti ahụ iji wee gaa n'ihu ịkwalite ezi ọchịchị na ebemnobi ndị Igbo na steeti ahụ. Ya bụ gọvanọ kwuputara nke a n'ụlọ ụka St. Mary (Katọliki) dị n'Ọraukwu n'okpuru ọchịchị Idemili Nọọtụ nke steeti ahụ n'ofufe nru dị nsọ achịkọbara iji wee gbaa ọnya ego maka ịrụ ọrụ n'ụlọ ụka ahụ.

Ọ mere ka a mara na ọ bụ naanị APGA bụ òtù pati ndị Igbo nwere n'ala Naịjiria ma sịkwa na ọchịchị ya adabeghị mba n'ụdị ọbụla n'ịtụpụta ezi atụmatụ mmepe na nke na-kwalite ezi ọnọdụ obibi ndụ ụmụ mmadụ kemgbe ọ banyere n'ọkwa ọchịchị.

Ọ kpọpụtara ọtụtụ ọrụ dị iche iche ọchịchị ya ji n'aka n'Ọraukwu, nke gụnyere ịrụgharị ahịa Eke Oye, ụlọ ahụike n'Ọraukwu, ịrụ ụzọ ahụ siri Ibenabo gaa Abacha, ịrụgharị ụlọ akwụkwọ Praịma dị n'obodo ahụ, na ihe ndị ọzọ, tinyere na gọọmenti ya eweela ụmụ afọ obodo ahụ n'ogoogo ọrụ dị iche iche n'ọchịchṅnọ ugbu a.

Ọ rịọrọ ndị Ọraukwu ka ha gaa n'ihu n'ịkwado ịzọ ọchịchịṅya nke ugboro abụọ ma kwe ha nkwa na ọ gaghị agharịpụ ha.

Ode akwụkwọ ukwu nke steeti ahụ bụ ọkammụta Solo Chukulobelụ, bụ nwa afọ obodo ahụ kwuru na n'ihi ihe gọvanọ ahụ megoro n'obodo ahụ, na o nweghị ihe ga-ezù ịkwụghachi ya, karịa ịtụnyere ya akwụkwọ ka ọ chịa nke ugboro abụọ.

N'okwuchukwu ya, onye Ọzịlarị Bishọọpụ nke achị Dịọsiisi Ọnịsha bụ 'Most Reverend' Dennis Isizọr kọwara mkpa ọ dị na ndị ụka Katọliki sonyesiri ike na nhọpụta ahụ na-akpụdobe nso na steeti ahụ site n'ịga ewere mpempe akwụkwọ ikike ha bụ votaas kaadị.

Ka ọ na-anabata ndị bịara ya bụ mmemme, eze ọdịnala nṅobodo ahụ bụ igwe Emeka Ọnụọrah gbara akaebe na mnwogha na ọrụ mmepe niile na-aga n'ihu na ngalaba niile nke steeti ahụ bụ n'ihi ezi ọhụhụ ụzọ nke gọvanọ Willie Obianọ, ma sịkwazie na ndị Anambra nwere nnọ ezi onye ndu ñụjuru mmiri ara afọ ma bụrụkwa onye ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n'obi.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Ndị NDLEA Anwụchikọọla Mmadụ Iri Asatọ n'Anambra Maka Ọgwụ Ike...

Ndị NDLEA Anwụchikọọla Mmadụ Iri Asatọ n'Anambra Maka Ọgwụ Ike...

Dịka a sị na a gbaghị Ụzọ oweri mgba ọ naghị echi, ụlọ ọrụ ahụ na-ebu agha megide ịkpọ, ma ọ bụ ịtụ mgbere ọgwụ ike, ngalaba ya nke steeti Anambra anwụchikọọla ma kpụgharịa mmadụ iri na asatọ, bụ ndị a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'ọgwụ ike Cannabis Sativa.

Òtù 'Apostle Amaka Care Foundation' Enyerela Ndị Ụwa Na-Atụ n'Ọnụ Aka n'Idemili...

Òtù 'Apostle Amaka Care Foundation' Enyerela Ndị Ụwa Na-Atụ n'Ọnụ Aka n'Idemili...

Obodo jupụtara nnọọ n'ọñụ ụbọchị ụka gara aga dịka otu òtù ọrụ obi ebere e jiri inyere mmadụ aka wee mara, bụ Apostle Amaka Care Foundation kpọkùrù ma nyere ndị ụwa na-atụ n'ọnụ aka.

Onyeisi Ndi Uwe Ojii Ọhụụ n'Anambra Ekwuo Ihe Ọ Ga-Elebà Anya. ■ Dụọ Ndị Otu Nzuzo Ka Ha Chọọ Ụzọ Ha...

Onyeisi Ndi Uwe Ojii Ọhụụ n'Anambra Ekwuo Ihe Ọ Ga-Elebà Anya. ■ Dụọ Ndị Otu Nzuzo Ka Ha Chọọ Ụzọ Ha...

Kọmishọna ọhụụ e wètara maka ndị uwe ojii na steeti Anambra, bụ maazị Danduara Mustapha ekwuola na ya ga-agbasi mbọ n'ịhụ na e nwere ezi nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ, dụọ ndị otu nzuzo na ndị na-ebute ala adịghị mma ka ha rie adụ dụọ onwe ha, ma rịọkwa ka e nwee ezi mmekọrịta n'etiti ọhznaeze na ndị uwe ojii, iji rụọ ọrụ ha nke ọma na n'ụzọ pụrụ kwesiri ekwesi.

Ụlọ Mgbasa Ozi Anambra Achịkọbarala Ndị Na-Azọ Ọkwa Ọchịchị Nrụrịta Ụka...

Ụlọ Mgbasa Ozi Anambra Achịkọbarala Ndị Na-Azọ Ọkwa Ọchịchị Nrụrịta Ụka...

Dịka otu n'ụzọ ịkwadobe nhọpụta ọchịchị ahụ na-abịa n'ihu n'ala anyị n'ahọ a, ụlọ mgbasa ozi 'Anambra Newspapers And Printing Corporation' bụ ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ 'National Light', Ka Ọ Dị Taa na 'Sportslight Xtra' ejikọọla aka ọnụ, ya na ọtụtụ ụlọ mgbasa ozi ndị ọzọ dị na steeti Anambra wee hazie ma chịkọba nrụrịta ụka maka ndị ji aha otu ndọrọ-ndọrọ dị iche iche azọ ọkwa sineeti na mpaghara ọgbọ nta nkwàdo sineeti atọ e nwere na steeti ahụ.

Peter Obi Akpokuona Ndi Igbo Ka Ha Binyere Ya Na Atiku Aka n'Akwukwo...

Peter Obi Akpokuona Ndi Igbo Ka Ha Binyere Ya Na Atiku Aka n'Akwukwo...

Obianọ Ekwe Nkwà Ịmàlite Agba Nke Atọ Nke Inye Obodo Ego Iji Họrọ Ma Rụọ Ihe Na-Akpa Ha...

Obianọ Ekwe Nkwà Ịmàlite Agba Nke Atọ Nke Inye Obodo Ego Iji Họrọ Ma Rụọ Ihe Na-Akpa Ha...

N'imezùpùtà nkwà ya nye ụmụ mmadụ na n'ịgbasò atụmatụ ezi ọchịchị o ji n'aka; aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na ọchịchị ya ga-anọ n'oge adịghị anya, màlite àgbà nke atọ nke amụmà inye obodo dị iche iche ego ka ha wee họrọ ma rụọ ihe na-akpa ha.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.