Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị òtù ọtụ ahụ ike nke mbà India, n'okpuru Rotary International, District 3170 ebunyela ụlọ nkuzi ahụ ike nke mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka ọtụtụ akụrụngwa e ji arụ ọrụ ahụ ike dị iche iche, bụkwa nke ọnụ ego ya ruru ndé kwùrú ndé Naịra.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Onye Ara Etiena Onye Ụkọchukwu Gwoo Gwoo Na Kogi

Otu onye ara a ma ama na steeti Kogi nọrọ ụnyaahụ weeṅtie onye ụkọchukwu gwoo gwoo ma menyekwa ya ihere dị egwu n'ihu. Nke ahụ bụ n'ihi na ya bụ onye ụkọchukwu kwechiiri ma kpebie na ọ ga-achụpụrịrị ya bụ nwoke ajọ mmụọ n'isi, ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị ya, n'ihi na akwụkwọ nsọ nyere ya ikike banyere mmụọ ọjọọ na mmụọ ara niile.

Otu onye ara a ma ama na steeti Kogi nọrọ ụnyaahụ weeṅtie onye ụkọchukwu gwoo gwoo ma menyekwa ya ihere dị egwu n'ihu.

Nke ahụ bụ n'ihi na ya bụ onye ụkọchukwu kwechiiri ma kpebie na ọ ga-achụpụrịrị ya bụ nwoke ajọ mmụọ n'isi, ma ọ chọrọ ya ma ọchọghị ya, n'ihi na akwụkwọ nsọ nyere ya ikike banyere mmụọ ọjọọ na mmụọ ara niile.

Onye akaebe nọ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ya bụ onye ụkọchukwu ụka ọgbara ọhụụ na-emekarị ihe ahụ oge ọbụla, na ọ na-ejekwa mgbe ụfọdụ kpọta ndị ahụ zuru oke ma gwa ha ka ha na-eme ka ndị ara na-agba, ka ọ ga-abụ o kpeere ha ekpere, ha adaa n'ala,  tụrụgharịa dịka ndi amụma na-ebu, ma blite kwuo n'ahụ adịna ya.

Mana ụbọchị ahụ bụụrụ ya ajọ ụbọchị dịka onye ara ahụ kụpụrụ ya ajọ mmụọ n'anya.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị òtù ọtụ ahụ ike nke mbà India, n'okpuru Rotary International, District 3170 ebunyela ụlọ nkuzi ahụ ike nke mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka ọtụtụ akụrụngwa e ji arụ ọrụ ahụ ike dị iche iche, bụkwa nke ọnụ ego ya ruru ndé kwùrú ndé Naịra.

Ọrịa Kánsà: A Dụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-Enyocha Ara Ha Oge Ọbụla...

Ọrịa Kánsà: A Dụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-Enyocha Ara Ha Oge Ọbụla...

A kọwaala mmadụ inyocha ara ya na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ nke ọma na oge ọbụla dịka ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi gbochie ọrịa nrechasị ahụ bụ ọrịa kansa ka ọ ghara ịgbasàwànyè.

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

Dịka a sị na ihe ọma na-aka mma na ọhà mara, a gbapeela ọmarịcha ahịa Nkwọ ọhụụ ahụ a rụụrụ ndị Nando site n'aka otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Chiifu John Iwunọ.

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Nsogbu ahụ iju mmiri na-akpazị na steeti Anambra ugbu a ataala isi mmadụ ọzọ, dịka ọ gbàgbùrù otu nwatakịrị gbara naanị ahọ iteghete n'okpuru ọchịchị Ọgbarù, bụ otu n'ime mpaghara ebe ahụ ya bụ ọnọdụ kawanyegoro njọ.

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nabàta onyeisi ụlọ ọba ego mba ụwa, bụ Maazị Rachid Benmessoud na mmadụ iri ndị ọzọ ya na ha sòrò bịa na steeti ahụ.

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Njirimara, omenala na ọnatarachi ndị Igbo bụ nnọọ nke pụtara ìhè nso nso a dịka ndị Obodo Ọzụbụlụ, dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke steeti Anambra merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.