Iri Ji Ọhụụ Nke Obodo Abagana Afọ 2017

Ọ bụ ihe oke ọñụ na mkpori dị egwu ma bụrụkwa oge igosipụta ịma mma nke ọnatarachi ndi Igbo, ka ndi obodo Abagana nke dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra nuputara n'igwè maka mmemme iri ji ọhụụ nke ya bụ obodo.

Dịka ọ bụ omenala zuru ala Igbo ọnụ, iri ji ọhụụ n'obodo bụ eze a ma na a ga-echirịrị ma bụrụkwa ichi a ma na a ga-egbu, kwa afọ ọbụla, tupuu ndi ọbụla kpọrọ onwe ha ezi ụmụ afọ Igbo amalite isi ma ọ bụ iri ji ọhụụ na be ha dị iche iche.

Ya bụ mmemme nke afọ a n'Abagana dọtara imirikiti mmadụ, ndi a maara aha ha nakwa ọtụtụ ndi e ji okwu ha agba izu, ndi sitere n'ebe dị iche iche n'ala Naịjiria nakwa na mba ofesi.

Ka ọ na-ekwu okwu na mmemme ahụ, Maazị Nwachukwu Anakwenze, bụ onye isi otu jikọtara ndi Anambra bi na mba Yụnaịted Steeti nke Amerika (USA) ma bụrụkwa onye ọrụ dọkinta bi na mba ahụ, kwuputara na ebumnobi ya bụ mmemme bụ iji gosi ụwa na ndi Igbo bụ agbụrụ Chukwu gọziri ma bụrụkwa ndi nwere ọnatarachi na omenala bụ ọka ibe na mba ụwa. O kwuputara na ndi Igbo bụ ndi na-agbasi mbọ ike, na-ejepụ ejepụ, na-akpa nwanne, ma na-elerukwa ndi ọbịa anya nke ọma.

Maazị Nwachukwu, bụkwa Onoowu nke Abagana sị na ọ bụ ndi Igbo a tọọrọ n'oge a na-azụ ahịa óhù (slave trade) bụ ndi tọrọ ntọ ala mmepe nke mba Amerika ma sikwa na ọ bụ nke a mere ndi Amerika jiri rụọ ebe ndebe ihe ọkpụ (museum) na mba ahụ iji wee kwanyere ndi Igbo ugwu. Mmemme ahụ ka o kwupakpara n'ezie na ọ bụ oge iji nọkọọ ọnụ dịka ụmụnne wee kpaa ma kpee ekpere maka uto na ọganihu nke obodo ahụ, steeti Anambra, ndi Igbo nakwa ala Naịjiria n'izugbe.

N'okwu nke ya, eze ọdịnala nke obodo ahụ, bụ igwe Patrick Mbamalị kelere n'ụzọ pụrụ iche ndi niile bịara ya bụ mmemme, ọkachasị ya Onoowu banyere ezi mbọ ha niile iji wee kwalite ọdịmma nke obodo ahụ na nke ndi Igbo na mba ụwa. Ọ nọkwazịrị n'oge ahụ kpee ekpere maka ahụ isike na ọdịmma nke igwe mmadụ ahụ na ụmụ afọ igbo nọ na mpaghara ebe dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu.

Eze ọdịnala Ifite Dunu, Igwe Emeka Iloụnọ bụ onye bịara ya bụ mmemme kwuputara n'ezie na omenala bụ ejiri mara ndi, ma rịọkwa arịrịọ ka ndi Igbo n'ụwa niile jigidesie omenala ha ike ma na-akwalitekwa ọkachasị asụsụ Igbo iji hụ na ọ nwughị ma ọ bụ funahị ha dịka òtu UNESCO buru n'amụma.

Ndi ọzọ kwuru okwu na ya bụ mmemme gụnyere maazị Ben Ụgha, bụ onye isi otu na-ahụ maka ọdịmma nke Abagana, onye D.P.O ndi uwe ojii n'Abagana bụ Ọkaiwu Dan Uke, onye gabụrụ ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti Anambra n'oge gara Họnọrebụụl George Ike-Okoye nakwa ụfọdụ ndi ọzọ.

Ịgba egwu ọdịnala dị iche iche nakwa igosi ihe ngosi dị iche iche e jiri mara Igbo so n'ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ. Ihe ndi ọzọ merekwara ka mmemme ahụ zaa aha ya bụ: iwa na ikesa ji ọhụụ ahụrụ ahụ, bụ nke e jiri mmanụ akwụ, ụkpaka, ose nakwa akwụkwọ ụtazị mara abụba wee chọọ mma, tinyere mmanya ngwọ jụrụ oyi, nke e jiri gbanyere ya ụgbọ nwamkpi.

Info
ProductDemo | 10 USD

Izunna Okafor is a lover and promoter of the Igbo language and culture. He joined the Igbo Radio in August 2017. We want to be able to give him at least $100 every month so that he can remain excited about this cause of saving our language and continue to write articles for the Igbo Radio and remain a part of our team of volunteer fighters who work hard to save Igbo language. Please donate whatever amount you can.

Register .NG Domain Name

Website Plaza Nigeria

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

E Jidela Mmadụ 8 n'Anambra Maka Imebìsì Gburugburu...

E Jidela Mmadụ 8 n'Anambra Maka Imebìsì Gburugburu...

A nwụchikọọla mmadụ asatọ na steeti Anambra maka ime na itinye aka n'ihe na-ebute mmebisi gburugburu, bụ ịsa ụgbọala n'ebe na-ekwesighị ekwesi.

Gọmmenti Anambra Amàchie Ibugharị Ahịa Na Ịzụ Ahịa n'Okporo Ụzọ...

Gọmmenti Anambra Amàchie Ibugharị Ahịa Na Ịzụ Ahịa n'Okporo Ụzọ...

Gọọmenti steeti Anambra amachiela kpam kpam ihe ọ bụla bụ ibugharị ahịa mbugharị na ịzụ ahịa n'okporo ụzọ ọbụla na steeti ahụ.

Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra...

Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra...

Dịka a sị na ọ bụ chi na-efo ihe ọma na ihe ọjọọ ana-efote, ndị oji egbe ezu, ndị a maghị ndị ha bụ agbagbuola maazị Frank Anthony Igboka, bụ onyeisi ọchịchị òbòdò Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra.

Ndị Keke Akwàtụọla n'Ọnịtsha, Merụọ Mmadụ Ise, Bibie Ọtụtụ Ihe...

Ndị Keke Akwàtụọla n'Ọnịtsha, Merụọ Mmadụ Ise, Bibie Ọtụtụ Ihe...

Obodo gbara nnọọ aghara ma sụọkwa wuruwuru nso nso a, dịka ndị na-anyà ihe ọnyịnyà Keke nwèrè nkwàtụ ma pịachara obere ọkpọ n'Ọnịtsha dị na steeti Anambra. Kàtàkátá bụ nke e kwuru na o wètààrà mmadụ ise mmerụ ahụ, ma bụrụkwa nke e si na ya wee bibie Keke ruru iri asaa n'ọnụ ọgụgụ.

Anyị Anaghị Ewepụ Ego Mgbakwụnye Mmanụ Ụgbọala Ugbua...

Anyị Anaghị Ewepụ Ego Mgbakwụnye Mmanụ Ụgbọala Ugbua...

Gọọmenti Etiti ekwuola na o nweghị ebumnobi ọ bụla ị wepụ ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala ugbua dịka ndị mmadụ juru ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'ọtụtụ obodo anyị.

Ụka Igunkwụ - Ndụ Ịchụ Àjà...

Ụka Igunkwụ - Ndụ Ịchụ Àjà...

Dịka nzukọ Kraịst mere mmemme ụka Igunkwụ n'ụbọchị Sọndee, onyeisi Nzukọ Kraịst na Naijiria, Ngalaba Oyo Steeti, arịọla ndị otu Kraịst ka ha were ohere ụka igunkwụ a were bido ibi ndụ ịchụ àjà.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.