E Guzobela Maazị Dom Okafọr N'Ọkwa 'Patron' Nke Otu Jikọtara Ndi Leyiti n'Ala Anyị...

Dịka e kwuru na ọkwa dị oke elu bụ maka ndi nwere ùgwù na nsọpụrụ, a nọrọ nso a wee guzobe otu nwa amadi e jiri inyere ndị mmadụ aka wee mara, bụ Chiifu Dọm Okafọr n'ọkwa dịka 'Patron' nke òtù ahụ jikọtara ndị leyiti n'ala anyị, ngalàbà Dayọsiisi Awka.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Akwa ariri n’onwu Professor Albert Chinualamogu Achebe

Ụmụnna m ndị Igbo, ndị CISA na ndị Wachet, gịnị ka anyị na-anụ? Onye nwụrụ? Ihe ukwu emeela n’ụbọchị ahịa ukwu! Oke osisi ndị Igbo ji eme ọnụ a daala! Mbazụ igwe ndị Igbo ji akpaa nganga agbajiela! Ọnwụ egburule Akanaede akwụkwọ, Professor Albert Chinụalamọgụ Achebe, Dimkpa Agụ ndị Igbo, Nwa diala ndị Ogidi, Anambra State! Onye Oji deekara onye Bekee n'oyibo! Onye Oji kuziri onye Ọcha otu eji asụ ma na-ede okwu Bekee! Oke Agụ ụmụ Igbo ji eme ọnụ! Chai, ike agwụla!

Chaị, echetala m n'oge anyị gụrụ Things Fall Apart, No Longer at Ease, Arrow of God, A Man of the People, na ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ Chinụa Achebe deere mgbe anyị nọ na sekọndịrị sukulu. Oge elu wụ ala ọsa, n'oge ụmụ akwụkwọ maa ihe ha na-eme, n'oge onye nkuzi kpọrọ ọlụ nkuzi ihe, n'oge agu nmuta na-achi! 

Professor Chinụa Achebe; Odogwu Nwoke, Nwoke obi ọma, Enyi ọha dum, O ji nwayọọ ejee! Ọchị agha! Nwoke na-eme ihe mgbe ihe siri ike. Chaị, onye ga-asị na Chinụa Achebe kwujọrọ ya? Ndị enyi m, ihe ọma anaghị ekwe ka ejide ya n’aka. Ọnwụ, egbuole Agụnaeche-Mba ndị Igbo ji a gaa mba! 

Chinụa, Nwoke udo zuru ahụ! Nwoke ọnụ ya jupụtara n’ekele! Omee mgbe ihe siri ike! Otu onye na-achụ ọgụ! Onye nduu ụmụ Igbo! Nwoke a nadịghị esi n’iru ya a paa mmanya! Chai, onye wetara mma e jiri gbue agụ? Ụmụnna m, ihe tagburu nkịta ataala arụ! Ọnwụ anaghị atụ ụjọ!   

Chinụa, hapụ n’ihi na Chi gị maara ihe mere gị. O nweghị ihe ụmụ Igbo pụrụ imee n’ihi na ọnwụ ka ike. Ndị CISA kwadoro itu gị akara ugo na Igbo Village dị na Staunton, Virginia taa na mmemme Retreat ha n'izu ụka a. Ọ wụrụ ihe ọgụ gaara igbochi, ndị CISA gbakoro n'Igbo Village gara eburu mma, egbe na ụta wee lụwa ya. Ụmụnwanyị na Ụmụada gbakọrọ n'ebe a gara eburu mkpara na aka odo ha ji-asụ nri wee lụwa nke ha. Ọnwụ gara ahụ ọgụ na mgba anya! Chai, egbe e burule nwa ọkụkọ n’iru nne ya! Anyamiri ejula anyị anya. Ụkwụ e jiela agụ, mgbada abịala ya ụgwọ!

Chinụa, ọkụ ị mụnyere n’ụwa agaghị anyụ anyụ! Mba nile akwụkwọ gị ruru gaa necheta ọlụ nile ị lụrụ n’ụwa. Chinụa, akwụkwọ Things Fall Apart ị deere agaghị anwụ anwụ. Ihe ncheta gị agaghị agwụ agwụ!

Ụmụ Igbo, anyị matara n’ugbo abụa ka ekwe na-akpọ dike - Ọ kpọ ya otu na ndụ, ọ kpọ ya nke ọzọ n’ọnwụ. Ọrịa gbue onye ọ tụrụ, ya ezuru ike! Chinụa, hapụcha! Ụjọ atụkwala gị n’ije gị n’ihi na onye ya na chi ya kwụụ n'ije, ụjọ ekwesịghị ịtụ ya! Anyị na-asị gị gbawa ọsọ gị, gbakwuru Chi kere gị, ebe ị ga-ezu ike maka ọlụ ọma nile ị lụrụ n’ụwa. Laa n’ụdo!! 

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

E Guzobela Maazị Dom Okafọr N'Ọkwa 'Patron' Nke Otu Jikọtara Ndi Leyiti n'Ala Anyị...

E Guzobela Maazị Dom Okafọr N'Ọkwa 'Patron' Nke Otu Jikọtara Ndi Leyiti n'Ala Anyị...

Dịka e kwuru na ọkwa dị oke elu bụ maka ndi nwere ùgwù na nsọpụrụ, a nọrọ nso a wee guzobe otu nwa amadi e jiri inyere ndị mmadụ aka wee mara, bụ Chiifu Dọm Okafọr n'ọkwa dịka 'Patron' nke òtù ahụ jikọtara ndị leyiti n'ala anyị, ngalàbà Dayọsiisi Awka.

Ndị Ntorobịa Ọmambala Erie Ji Ọhụụ...

Ndị Ntorobịa Ọmambala Erie Ji Ọhụụ...

Obodo juru nnọọ kpụmkpụm n'ọnụ ụbọchị..... dịka ndị ntorobịa Ọmambala zukọrọ ma nuputakwa n'ịgwè wee merùbe mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

Oke Ọñụ Adaa Dịka Dọm Okafọr Bunyere Ndị Ọlụsị Ígwè Na-Enye Ọkụ Latiriiki n'Awka...

Oke Ọñụ Adaa Dịka Dọm Okafọr Bunyere Ndị Ọlụsị Ígwè Na-Enye Ọkụ Latiriiki n'Awka...

Oke ọñụ dara nnọọ n'ogige Ọkammụta Dọra Akụnyịlị 'Women Development Centre' dị n'Awka, dịka otu nwoke e jiri inyere ụmụ mmadụ aka wee mara, ma bụrụkwa onye ọnọdụ ụmụ mmadụ na-emetụ n'obi, bụ maazị Dom Okafọr buyere ndị ọlụsị otu nnukwu ígwè na-enye ọkụ ka ha wee na-arụ ọrụ n'ebe ahụ.

Ìjú Etokpòlá 'Federal Poly, Oko'... ● Ndị Ndu Gwa Ụmụakwụkwọ Ka Ha Laa Ezumike Mberede...

Ìjú Etokpòlá 'Federal Poly, Oko'... ● Ndị Ndu Gwa Ụmụakwụkwọ Ka Ha Laa Ezumike Mberede...

Dịka ámụmá ahụ e buru na-abịa na mmezu ugbu a, ìjú mmiri awakpòla ma tokpòkwa ụlọ akwụkwọ 'Federal Poly Oko', ngalàbà ya nke dị n'Atànị n'okpuru ọchịchị Ọgbarụ nke steeti Anambra.

A Ga-Amàchi Ịhụta Mmadụ Dịka Òsú n'Ahọ a...

A Ga-Amàchi Ịhụta Mmadụ Dịka Òsú n'Ahọ a...

E meela ka a mara na ịkpọ ma ọ bụ ịhụta mmadụ dịka òsú n'ala Igbo ga-abịa n'isi njedobe n'ahọ a, ma bụrụkwa nke a ga-amàchi kpamkpam na mmemme Ilommụọ Ndị Igbo nke ahọ 2018, bụ nke ga-ewere ọnọdụ n'obi Eze Nri dị n'okpuru ọchịchị Anaọcha dị na steeti Anambra.

SEMA Na Ndị Ọrụ Agha Ala Anyị Ga-Ejikọ Aka Ibuso Ìjú Mmiri Agha n'Abambra...

SEMA Na Ndị Ọrụ Agha Ala Anyị Ga-Ejikọ Aka Ibuso Ìjú Mmiri Agha n'Abambra...

Dịka a gara n'ihu na-ama ọkwa ma na-ebukwa amụma dị iche iche banyere mkpamkpa dị iche iche ìjú mmiri aghaghị ịkpa na steeti dị iche iche n'ahọ a, ndị ọrụ agha ala anyị ekwela nkwà ma kwupụta njikere ha ijikọ aka ọnụ, ha na ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ọnọdụ mberede na steeti Anambra, bụ Anambra State Emergency Management Agency n'ibuso nsogbu iju mmiri agha na steeti ahụ.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.