Onye isi ala mba Venezuela, Hugo Chavez, anwụọla. Ọ nwụrụ taa bụ Tuzdee. Ọ gbara nanị afọ 58 tupu ọnwụ egbuo ya.

A na-akọ maka onye isi ala Amerịka, Barack H. Obama, taa. Taa ka Obama mere ịṅụ iyi ịchị obodo Amerịka afọ anọ ọzọ, maka ọlụ ọma nke ọ lụrụ n’afọ anọ nke gwụrụ ụnyịahụ. Mazị Dr. Martin Luther King Jr. bụkwa tata ka anyị nakwa echeta maka ọmụmụ ya. Nwoke mụ a bụ agụ nwoke.

Mgbọ ogbunigwe awụnyego aja na garrị n’obodo Boston, na Steeti Massachusetts, na mba Amerịka. N’ụbọchị Mọndee, ụwa niile gbakọtara na Boston maka asọmụmpi ọsọ onye mere ike ya, nke a kpọrọ Boston marathon, n’olu bekee.

Jonathan na-ekwu na obi dị ndị Nigeria ụtọ maka ọnọdụ ọkụ latrik. Onye isi ala Nigeria, Goodluck Jonathan, kwuru okwu na CNN ụnyaa bụ abalị 23 nke ọnwa Jenụwarị. Nwanyị onye nta akụkọ CNN, Christiane Amanpour, gbara Jonathan ajụjụ ọnụ gbasara ọchịchị ya, na ọnọdụ udo na nchekwa n’ala Nigeria.

Ndị mba Amerịka eduona Barack Husain Obama n’iyi-ọlụ maka ịmalite agba nke abụọ ọchịchị ya. Obama na-achị Amerika kemgbe afọ anọ. N’usoro akwụkwọ iwu mba ahụ, onye isi ala na-achị afọ anọ. Afọ anọ ahụ gafee, o nwere ike iso me ndọrọndọrọ ọchịchị. Ọ bụrụ n’o nwee mmeri, ọ ga-achị afọ anọ ọzọ. Nke a pụtara n’onye isi ala nwere ike ịchị nanị afọ asato na mba ahụ.

More Articles ...