Ndi mmadu na-achu afo

Taa ka a na-achụ afọ. Taa bụ abalị mbụ nke ọnwa jenụwarị ka a na-achụ afọ n’ebe dị iche iche. E jiri ọkpụkpa ọkụ nọkaụtụ mara ịchụ afọ.

Otu nwanyi onye Calgary

Ozi anyị nwetere n’aka ndị CBC na-akọwa n’otu nwanyị onye Calgary ga-aga nga mkpụrụ afọ iri na atọ. Ikpe mara Stacey Joy Bourdeaux maka igbu otu nwa ya nwoke. N’afọ 2004, Stacey gburu nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ, ma na-achọkwa igbu nwa ya nwoke nke ọzọ gbara afọ ise.

Otu onye ọkaikpe na mba Amerịka atụọla nwa afọ ala Nigeria nga mkpụrụ. Dịka a na-ewere otu ogbe ọka na-atụpụ nanị otu mkpụrụ ọka nay a kwa afọ, nga mkpụrụ ọka bụ nga ebighi ebi, nke onye a tụrụ ya ga-anọgide n’ime ya were ruo n’ụbọchị ọnwụ ya.

Otutu umu Nigeria anwuala

Ndị Nigeria bụ oji abalị eme ihe. Ha abụghị kwa oji abalị eje, ndị ekperima cha cha! Kama na ọ bụ mgbe ohere dapụtara ha iji gbo mkpa nke ha. Dịka agwa ndị e nwe enwe ha na-emechasị ihe ọga chọrọ, tupu ha nwee ohere ime ihe nke dị ha mkpa.

Ọ bụ gịnị mere? Ọ bụ gịnị ka anyị na-akwara akwa? Ụmụnna m ndị Igbo bi n’Amịrịka, ihe ukwu emeela n’ụbọchị ahịa ukwu! Mmiri na-erughị eru, ezoola! Ụkwa na-achaghị acha, adaala! Mkpara-igwe ụmụ Igbo etijiele n’ike! Ji esile n’ọdụ kaa! Ọnwụ abatala, ụlọ ajụọla oyi.

Taa bụ sọndee, gọọmenti Amerịka ekwuona na onye agha ahụ ndị soja Afghanistan gburu na nso a bụ onye Amerịka.

Ọnụ ọgụ ndị agha mba Amerịka e gburu n’agha na mba Afganistan eruona 2,000. Nke a na-echetere ụwa na agha na-eri isi mmadụ. Nke a mere ya afọ 11 kemgbe a malitere ịlụ agha ahụ na Afganistan. Gọọmenti Barack Obama ekwuona na ndị Amerịka ga-ewete agha ahụ n’isi njedebe n’afọ 2014. Mana ọtụtụ ndị Amerịka akwadozighị yabụ agha a na-alụ.

More Articles ...