Top Stories

Grid List

Igbo sị na ọ na-abụ onye zoro ezoro gafee, e zoro ezoro chụba ya. N'ịgbaso nke a, o mere ndị mmadụ vam n'anya na nso nso a, dịka ndị ọrụ nchekwa na steeti Anambra gbachibìdòrò ma nwụchie ótù nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau dị na mpaghara mgbago ugwu ala Nigeria wee buru ndị mmadụ na-abata n'ime steeti ahụ (Anambra), na-agbanyeghị na gọọmenti nyere iwu ka e mechigodi ókè ala steeti niile ugbua n'ihi ọrịa nje korona.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela atụmatụ mmiri ọñụñụ mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka 'Otuocha Regional Water Supply Scheme'.

Nnekwu ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ, ebe ndị Igbo sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ. Ka ọ dị taa, n'iji sị ya jisie ike, otù ụlọọrụ ngo mba China ejirila ihe erimeri dị iche iche wee kwàdo gọọmenti steeti Anambra n'agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona nà mmetụta ya dị iche iche n'ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.

Ngagharị ịwe na Spen

Yuropu

O weghị oge onye isi ọchịchị mba Spen, Mariano Rajoy, kwuchara na Spen ga-eweghara ọchịchị mpaghara Katalonịa ahụ na-achọ ịnwere onwe ya site n’aka Spen, igwe mmadụ gbakọrọ na mpaghara Katalonịa na Spen dị ịche ịche maka ịme ngagharị ịwe.

Ndị ọrụ ubi si mba Rọshịa

Yuropu

Osote onye isi ala bụ Yemi Osinbajo, ekuola n’Ọ ka mma ịkwado ọrụ ubi n’ime obodo karịa ịtụbata ngwa ahịa nke agaghị enye aka na mgbanwe ego.

Osinbajo mere ka A mata nke a mgbe Ọ nabatara ndị mba Rọshịa dunyere, nke onye ndu ha bụ onye minista ọrụ ugbo mba Rọshịa, Maazị Alexander Tkachev, bụkwa onye isi oche nke otu kọmishọn jikọrọ Naịjirịa na Rọshịa.

Ihe mberede ụgbọelu

Yuropu

N’ụbọchị Tuzdee, otu ụgbọelu bu mmadụ 150 dara kpọkasịa n’ugwu Alps e nwere na mba Frans. Ụgbọelu ahụ, bụ nke ndị Germanwings na-akwọ, si mba Spen na-alaghachị mba Jamini. Ụgbọelu ahụ bu ọtụtụ ụmụ afọ mba Jamini na mba Spen. A chọpụtara n’ụmụ akwụkwọ 16 ndị Jamini so na ndị a na-achọ achọ.

Otu nwaafọ Nigeria na-arịa ọrịa korona na mba China ataala onye nọọsụ mba China na-elekọta ya arụ, dịka ọ na-agbakàrị àlà isi ebe a na-elekọta ya gbapụ.

Aka akparala nụ ezekaudele, o kwuo onye chiri ya ọzọ. Onye isi ndị otu agha iyi egwu ahụ a ma ama n’ụwa niile dịka ISIS anwụọna. Baghdadi, nwoke onye okpukperechi alakụba, nke na-achị ndị otu a kpọrọ izlamik steeti, ezutego ọnwụ ya na mba Sirịa.

Mmadụ 60 anwụọna n’Afganistan

Eshia

Ndị agha iyi egwu egbuona ịhe karịrị mmadụ 60 na Kabul yana Ghor. N’ụbọchị Fraịdee, abalị 20 nke ọnwa Ọkụtoba, ndị uwe ojii na Kabul kwuputere n’otu nwoke buuru egbe chịrị mgbọ gawa n’ụlọ okpukpere chi ndị ụka alakụba Shịa.

Mba Kanada eweghachina onye Praịm Mịnịsta mba ahụ bụ Justin Trudeau n’ọkwa ọchịchị. Trudeau nwetere mmeri dịka onye isi ala mba Kanada na ntụli aka ozuru-igbo nke e mere na mba ahụ ụnya bụ abalị 21 nke ọnwa Ọkụtoba.

Mick Mulvaney, otu n'ime ndị ọkwa ha gbagoro agbago na White House, obi gọọmenti mba Amerịka, atabiena ire taa. Ọ tọghere ngịga n'igbudu ahịa. Mgbe Mulvaney na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Wọshingtịn, n'ụbọchị Tọzdee, mgbe ọ na-aza ajụjụ, Mulvaney kwetere na ịhe Prezidenti Trump jiri hapụ ịnye ndị Yukren $400 M (narị ijeri dọla anọ) ndị omebe iwu mawapụtara ha bụ iji mee ka Yukren mere ya ihe ahụ ọ chọrọ.

Onye nnọchite anya ndị Baltimore n’ụlọ nzukọ omebe iwu mba Amerịka, bụ Maazị Elaịja Commings, anwụọla. Nwa amadị ahụ nwụrụ n’isi ụtụtụ taa bụ Tọzdee, n’ụlọ ọgwụ John Hopkins, site n’ahụ mgbu nke O nwere kemgbe.

Sign up via our free email subscription service to receive notifications when new information is available.
Advertisement