Mmadụ Iri Abụọ Anwụọla ma bụrụkwa Ndị Merụrụ Ahụ na Ihe Mberede...

Ọtụtụ ndị mmadụ atụfuela ndụ ha ebe ndị ọzọ bụzi ndị nwetagasịrị ihe mmerụ ahụ dị iche iche n'ihe mberede ahụ mere na Ọnịcha, obodo ahịa nke Steeti Anambra. Ya bụ ihe mberede mere ka mkpụrụ ụbọchị abụọ ụlọ elu dị ogogo atọ dachara na Steeti Lagos.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Ụmụada Igbo Akpọọna Oku Maka Ịkwalite Asụsụ Na Omenala Igbo

Otu a kpọrọ 'Ụmụada Igbo', bụ otu jikọtara ụmụada Igbo niile ma ndi bi n'ala Naịjiria na mba ofesi akpọkuona ndi nne na nna na ụmụafọ Igbo niile maka ịkwalite asụsụ, njirimara na omenala Igbo, bụ nke na-anwụzị anwụ ugbu a.

Oku a dị oke mkpa bụ nke a kpọrọ site n'ọnụ ndi otu a n'agba nke abụọ nke ọgbakọ izugbe ha, nke ahọ 2017.

Ka ọ na-ekwu okwu na ya bụ nnukwu ọgbakọ, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọ ụka 'St. Patrick's Cathedral Awka' na steeti Anambra; onye isi izugbe nke otu ahụ, ma n'ala Naịjiria na mba ofesi, bụ 'Chief' Dọkịnta Kate Ezeọfọr mere ka a mara na isi sekpụ ntị n'ihe e jiri hibe otu ahụ bụ ịzọpụta na ịkwalite ọnatarachi ndi Igbo, bụ nke na-anwụzị anwụ ugbu a, site n'ịchịkọba ọgbakọ dị iche iche maka ụmụakwụkwọ Igbo na ndi nne na nna; ichekwaba ikike dịịrị ụmụ nwaanyị, nakwa inyere ndi ụwa na-atụ n'ọnụ aka.

Ọ kpọrọ oku ka a malite ịkụnye ihe ndị a na ndụ ụmụ afọ Igbo site na nwata, ma sikwazie na e debanyego aha otu ahụ n'akwụkwọ na mba 'United States' nke Amerika.

O kelere Gọvanọ Willie Obianọ na nkwado ọchịchị ya na-enye otu ahụ, ma kpọkuziekwa ụmụ afọ ndị ọzọ selitere isi na ndi aka ji akụ ka kwado otu ahụ, dịka ihe e jiri wube ya bụ n'ihi ihe metụtara mmadụ, na ọdịmma nke ndị Igbo n'izugbe.

N'okwu nke ya, onye isi mmemme ahụ ma bụrụkwa onye isi izugbe nke Ohaneze Ndi Igbo, bụ 'Chief' Nnia Nwodo, toro ndị otu ahụ maka ezi nzọpụ ụkwụ ahụ ha zọpụrụ iji wechighata ebube na njirimara ndị Igbo, bụ nke funahịgoro ha, ma kwe nkwa nkwado nke Ohaneze Ndi Igbo nye otu ahụ.

Okwekwara nkwa ime ka ndị gọvanọ niile nke ndịda-ọwụwa anyanwụ mara maka ebumnobi nke otu ahụ, iji wee nwetewanye nkwado site n'aka ọchịchị ha, ma dụziekwa nne na nna igbo ọdụ ka ha na-ahụta ya dịka ọrụ dịịrị ha mgbe niile, bụ ịkụziri ụmụ ha asụsụ Igbo n'ihi na ọ bụ njirimara ha.

Ka ọ na-eme ka ụmụ nwaanyị mara ihe dị iche iche gbasaara ọnọdụ ahụ ike, otu onye ọrụ ahụ ike bụ Dọkịnta Richard Edeọnụ kwuru na ịtụ aro maka ezinaụlọ dị mkpa nye ezinaụlọ ọbụla n'ihi na ọ ga-eme ka ezinaụlọ ọbụla mụọ ụmụ ole ha ga-azụnwu nke ọma, ma n'agụm akwụkwọ ma n'ihe ndị ọzọ; ma sịkwazie na imesapụ ahụ bụ nnọ ụzọ kacha mma iji emeriṅọrịa kansa.

Dọkịnta Edeọnụ kọwara ọrịa kansa dịka ọrịa jọgburu onwe ya ma sịkwa na ọrịa kansa ara so na nke kacha éwü èwù. Ọ dụzịkwara ụmụ nwaanyị ka ha na-enyocha ara ha oge nille ma kọwatakwara onye dọkịnta ihe ọbụla gbara ha gharị n'ihi na ya bụ ọrịa na-adị mfe ọgwụgwọ ma a chọpụta ya n'oge.

Egwu ọdịnala ụmụada ahụ gụrụ na ihe ngosi ndi ọzọ so n'ihe pụtakarịchara ihe na mmemme ahụ.

Info
ProductDemo | 10 USD

Izunna Okafor is a lover of the Igbo language. He joined the Igbo Radio in August 2017. We want to be able to pay him at least $100 per month so that he can conitnue to write articles for the Igbo Radio and remain a part of our team of volunteer fighters who work hard to save Igbo language. Please donate whatever amount you can.

Register .NG Domain Name

Website Plaza Nigeria

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Mmadụ Iri Abụọ Anwụọla ma bụrụkwa Ndị Merụrụ Ahụ na Ihe Mberede...

Mmadụ Iri Abụọ Anwụọla ma bụrụkwa Ndị Merụrụ Ahụ na Ihe Mberede...

Ọtụtụ ndị mmadụ atụfuela ndụ ha ebe ndị ọzọ bụzi ndị nwetagasịrị ihe mmerụ ahụ dị iche iche n'ihe mberede ahụ mere na Ọnịcha, obodo ahịa nke Steeti Anambra. Ya bụ ihe mberede mere ka mkpụrụ ụbọchị abụọ ụlọ elu dị ogogo atọ dachara na Steeti Lagos.

Ntụliaka Ghere Anya Oghe Ga-Enyere Ala Anyị Aka N'Otito...

Ntụliaka Ghere Anya Oghe Ga-Enyere Ala Anyị Aka N'Otito...

Onye zọrọ osote onye isi ala na ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party nke ọnwa Febrụwarị ụbọchị iri abụọ na atọ, n'afọ puku abụọ na iteghete na Ntụliaka nke onye isi ala, bụ Maazị Pita Obi, ekwuola na o nweghị obodo ga-eto eto ma o nweghị ezi ụzọ pụtara ìhè ma ghere anya oghe n'usoro nhọpụta ọchịchị.

Mmadụ Iteghete, tinyere Ụmụ Aka, Anwụọla na Ọgbaghara Dị na Kaduna...

Mmadụ Iteghete, tinyere Ụmụ Aka, Anwụọla na Ọgbaghara Dị na Kaduna...

Ozu mmadụ iteghete, tinyere ụmụ aka, bụ nke ndị ọlụ nchekwa butegoro n'ọgba aghara ahụ ebe agbara ọtụtụ ụlọ ọkụ n'otu obodo.

PDP na Atiku Achikọtala Ndị Aka Ebe Karịrị Narị Anọ N'Ọgụgụ...

PDP na Atiku Achikọtala Ndị Aka Ebe Karịrị Narị Anọ N'Ọgụgụ...

Otú ndọrọndọrọ ọchịchị People's Democratic Party na onye zọrọ onyeisiala n'okpuru ya bụ ndọrọndọrọ ọchịchị na ntụliaka ahụ emere na ọnwa Febrụwarị, abalị iri abụọ na atọ n'ime afọ puku abụọ na iteghete, Alhaji Atiku Abubakar, kwuru n'ụbọchị Mondee na ha achịkọtala ndị aka ebe karịrị narị anọ ga-agba ama N'Ọgbakọ Ụlọ Ikpe Mkpesa N'ahụ maka Ntụliaka Onyeisiala, bụ ebe ha ga-anọ were maa ugo ahụ nke Onyeisiala Muhammadu Buhari tùrù na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ All Progressive Congress aka n'ihu na ntụliaka ahụ emere.

E Jidela Mmadụ Iri Atọ Na Ise n'Anambra Maka Ọgwụ Ike...

E Jidela Mmadụ Iri Atọ Na Ise n'Anambra Maka Ọgwụ Ike...

Site na njikọaka ọnụ nke ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ọgwụ ike n'ala Nigeria, bụ 'National Drug Law Enforcement Agency' (NDLEA), ndị ọrụ agha ala anyị, ndị uwe ojii, ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ, ndị ụlọ ọrụ na-ahụ maka mbàtá na ọpụpụ n'ala anyị, bụ 'Nigerian Immigration Service' na ndị ndị ọrụ nchekwa mmadụ nkịtị, bụ 'Nigeria Security and Civil Defence Corps' a nwụchikọọla mmadụ iri atọ na ise a na-enyo ènyò na ha na-etinye aka n'ihe metụtara ọgwụ ike.

Ala Nigeria Ahọpụtala Ndị Gọvanọ Na Ndị Omebe Iwu Steeti Dị Iche Iche...

Ala Nigeria Ahọpụtala Ndị Gọvanọ Na Ndị Omebe Iwu Steeti Dị Iche Iche...

Dịka a chịkọtara nhọpụta ọchịchị nke ahọ 2019 n'ala bịara n'isi njedobe, a họpụtala ndị gọvanọ ọhụụ na ndị omebe iwu ọhụụ na steeti dị iche iche.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.