Nnamdi Kanu enwerego onwe ya

Site na mkpebi onye okaịpke ukwu nyere n’ụlọ ikpe Hayị Kọt dị n’Abụja, isi obodo ala Naịjirịa, otu nwaafọ Igbo ụwa niile ma ama maka mbọ Ọ na-agba ka ndị Igbo nwete Biafra, abụrụgo onye nwere onwe ya ọzọ.

Nke a mere n’abalị iri abụọ n’ise nke ọnwa Eprelu afọ 2017. Onye ọkaịkpe bụ Binta Nyako ekpebigo ka A nara Nnamdi Kanu n’aka mbe site n’ịnwete mmadụ atọ ga-akwụ narị nde naịra, were gbara ya n’aka mbe.

Binta Nyako nyere Nnamdi Kanu iwu ka Ọ ghara ịza ndị nta akụkọ ajụjụ ọnụ, ma ọ bụ isonye n’ọgbakọ ọbụna ịhe karịrị mmadụ iri nọ na ya.

Nyako kwuru sị na A ga-eweghachị Nnamdi Kanu na mkpọrọ ma ọ bụrụ na Ọ daa iwu ndị a.

Ihe gbaziri ndị mmadụ gharị bụ na onye ọkaịkpe ahụ bụ Nyako ekweghị ka A tọghapụ mmadụ atọ ndị ọzọ E ji ha na Nnamdi Kanu.

Anyị nụkwara na ịhe kachara mee E jiri hapụ Maazị Kanu bụ na ya onwe ya ejichaghị ahụ.

Dọturu akụkọ a

Register .NG Domain Name

Website Plaza Nigeria

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

E Jidela Mmadụ 8 n'Anambra Maka Imebìsì Gburugburu...

E Jidela Mmadụ 8 n'Anambra Maka Imebìsì Gburugburu...

A nwụchikọọla mmadụ asatọ na steeti Anambra maka ime na itinye aka n'ihe na-ebute mmebisi gburugburu, bụ ịsa ụgbọala n'ebe na-ekwesighị ekwesi.

Gọmmenti Anambra Amàchie Ibugharị Ahịa Na Ịzụ Ahịa n'Okporo Ụzọ...

Gọmmenti Anambra Amàchie Ibugharị Ahịa Na Ịzụ Ahịa n'Okporo Ụzọ...

Gọọmenti steeti Anambra amachiela kpam kpam ihe ọ bụla bụ ibugharị ahịa mbugharị na ịzụ ahịa n'okporo ụzọ ọbụla na steeti ahụ.

Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra...

Ndị Òjì Egbè Abagbuola Onyeisi Ọchịchị Obodo Nimo n'Anambra...

Dịka a sị na ọ bụ chi na-efo ihe ọma na ihe ọjọọ ana-efote, ndị oji egbe ezu, ndị a maghị ndị ha bụ agbagbuola maazị Frank Anthony Igboka, bụ onyeisi ọchịchị òbòdò Nimo dị n'okpuru ọchịchị Njikọka na steeti Anambra.

Ndị Keke Akwàtụọla n'Ọnịtsha, Merụọ Mmadụ Ise, Bibie Ọtụtụ Ihe...

Ndị Keke Akwàtụọla n'Ọnịtsha, Merụọ Mmadụ Ise, Bibie Ọtụtụ Ihe...

Obodo gbara nnọọ aghara ma sụọkwa wuruwuru nso nso a, dịka ndị na-anyà ihe ọnyịnyà Keke nwèrè nkwàtụ ma pịachara obere ọkpọ n'Ọnịtsha dị na steeti Anambra. Kàtàkátá bụ nke e kwuru na o wètààrà mmadụ ise mmerụ ahụ, ma bụrụkwa nke e si na ya wee bibie Keke ruru iri asaa n'ọnụ ọgụgụ.

Anyị Anaghị Ewepụ Ego Mgbakwụnye Mmanụ Ụgbọala Ugbua...

Anyị Anaghị Ewepụ Ego Mgbakwụnye Mmanụ Ụgbọala Ugbua...

Gọọmenti Etiti ekwuola na o nweghị ebumnobi ọ bụla ị wepụ ego mgbakwụnye mmanụ ụgbọala ugbua dịka ndị mmadụ juru ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'ọtụtụ obodo anyị.

Ụka Igunkwụ - Ndụ Ịchụ Àjà...

Ụka Igunkwụ - Ndụ Ịchụ Àjà...

Dịka nzukọ Kraịst mere mmemme ụka Igunkwụ n'ụbọchị Sọndee, onyeisi Nzukọ Kraịst na Naijiria, Ngalaba Oyo Steeti, arịọla ndị otu Kraịst ka ha were ohere ụka igunkwụ a were bido ibi ndụ ịchụ àjà.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.