Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị òtù ọtụ ahụ ike nke mbà India, n'okpuru Rotary International, District 3170 ebunyela ụlọ nkuzi ahụ ike nke mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka ọtụtụ akụrụngwa e ji arụ ọrụ ahụ ike dị iche iche, bụkwa nke ọnụ ego ya ruru ndé kwùrú ndé Naịra.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Abalị 29 nke ọnwa Mee bụ ụbọchị ezum-ike ọchịchị onye kwuo uche ya

Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya. Ozi anyị nwetere site n’aka ngalaba mgbasa ozi n’asụsụ Igbo nke ụlọ ọrụ Voice of Nigeria kwuru n’onye Mịnịsta na-ahụ maka ịhe na eme n’ala Naịjirịa bụ Adulrahman Bello Dambazau, onye lagoro ezum-ike nka dịka Lieutenant General, kelere ndị Naịjirịa maka emume a.

Ala Naịjirịa eweputego taa bụ Mọnde, abalị 29 nke ọnwa Mee, dịka ụbọchị ezum-ike ndị ọrụ maka mmemme ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ozi anyị nwetere site n’aka ngalaba mgbasa ozi n’asụsụ Igbo nke ụlọ ọrụ Voice of Nigeria kwuru n’onye Mịnịsta na-ahụ maka ịhe na eme n’ala Naịjirịa bụ Adulrahman Bello Dambazau, onye lagoro ezum-ike nka dịka Lieutenant General, kelere ndị Naịjirịa maka emume a.

O kwuru na mmemme a A na-eme n’ubochị taa na-egosikwa na ọchịchị onye-isi ala bụ Muhammadu Buhari agbala afọ abụọ.

Adulrahman Bello Dambazau kwekwara ndị Naịjirịa nkwa n’ọchịchị dị ugbu a ga-agba mbọ ịhụ na E meziri ọnọdụ akụ n’ụba ala Naịjirịa.

Mịnịsta Dambazau kwuru na gọọmenti na-agba mbọ maka ịkwalite ọnọdụ ezi nchekwa site n’ibu agha megide mpụ. Ọ kpọkuru ndị Naịjirịa ka ha kwado gọọmenti n'ime ka ọchichi onye kwuo uche ya nọgide.

Dọturu akụkọ a.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị Ọrụ Ahụike India Ebunyela COOU Ọtụtụ Akụrụngwa Ọrụ Ahụ Ike...

Ndị òtù ọtụ ahụ ike nke mbà India, n'okpuru Rotary International, District 3170 ebunyela ụlọ nkuzi ahụ ike nke mahadum Chukwuemeka Ọdụmegwu Ojukwu dị n'Amakụ Awka ọtụtụ akụrụngwa e ji arụ ọrụ ahụ ike dị iche iche, bụkwa nke ọnụ ego ya ruru ndé kwùrú ndé Naịra.

Ọrịa Kánsà: A Dụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-Enyocha Ara Ha Oge Ọbụla...

Ọrịa Kánsà: A Dụọla Ụmụnwaanyị Ka Ha Na-Enyocha Ara Ha Oge Ọbụla...

A kọwaala mmadụ inyocha ara ya na akụkụ ahụ ya ndị ọzọ nke ọma na oge ọbụla dịka ụzọ pụtakarịchara ìhè a pụrụ isi gbochie ọrịa nrechasị ahụ bụ ọrịa kansa ka ọ ghara ịgbasàwànyè.

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

A Gbapeela Ahịa Nkwọ Nando A Rụrụ Ọhụụ...

Dịka a sị na ihe ọma na-aka mma na ọhà mara, a gbapeela ọmarịcha ahịa Nkwọ ọhụụ ahụ a rụụrụ ndị Nando site n'aka otu nwaafọ obodo ahụ, bụ Chiifu John Iwunọ.

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Iju Mmiri Agbàgbuola Nwatakịrị Gbara Ahọ Iteghete n'Ọgbaru, Anambra...

Nsogbu ahụ iju mmiri na-akpazị na steeti Anambra ugbu a ataala isi mmadụ ọzọ, dịka ọ gbàgbùrù otu nwatakịrị gbara naanị ahọ iteghete n'okpuru ọchịchị Ọgbarù, bụ otu n'ime mpaghara ebe ahụ ya bụ ọnọdụ kawanyegoro njọ.

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Obianọ Ànabàtá Onyeisi Ụlọ Ọba Ego Mba Ụwa n'Ala Anyị. ■ Kwe Nkwà Ịkwàdò Amụmà Ha...

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụbọchị Tuzdee wee nabàta onyeisi ụlọ ọba ego mba ụwa, bụ Maazị Rachid Benmessoud na mmadụ iri ndị ọzọ ya na ha sòrò bịa na steeti ahụ.

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Ọzụbụlụ Ewere Ọñụ Rie Ji Ọhụụ...

Njirimara, omenala na ọnatarachi ndị Igbo bụ nnọọ nke pụtara ìhè nso nso a dịka ndị Obodo Ọzụbụlụ, dị n'okpuru ọchịchị Ekwusigo nke steeti Anambra merùbèrè mmemme iri ji ọhụụ ha nke ahọ 2018.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.