E Keela Otu Nwoke n'Osisi, Pia Ya Tọọ Tọọ Maka Ịkwaso Nwatakịrị Iko n'Iké...

Ụbọchị bụụrụ nnọọ otu nwoke e tie okwe e rie oke n'isi ngwụcha izu ụka gara aga dịka ụmụ okorobịa iwe juru obi kere ya agbụ, wụọ ya agbara aka n'ahụ ma were ụtarị pịa ya tọọ tọọ maka ịkwaso nwata gbara naanị ahọ asaa.

Guchaa Akuko a Guoo Akuko Ndi Ozo

Anyị Agaghị Ekwe Ka E Gwuo Ojoro Ọbụla na Nhọpụta Anambra --- Ndị Ahịa

Otu jikọtara ndị ahịa na steeti Anambra bụ AMATAS n'aha mkpirisi na nke jikọtara ndị ahịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ ala anyị bụ SEAMATA ekworona ntutu taa ma kpebie na ha agaghị ekwe ka e nwee ihe ọbụla bụ igwu ojoro n'ụdị ọbụla na nhọpụta ọchịchị na-abịa n'ihu na steeti ahụ, site n'aka mmadụ ọbụla ma ọ bụ otu ọbụla.

Onye isi ndị otu a bụ maazị Okwudịlị Ezenwankwọ mere ka a mara nke a ụbọchị Tọzdee oge ndị otu jikọrọ ndị na-arụpụta akpụkpụ ụkwụ na Anambra bụ SMAAS bịara kpọtụrụ ya n'isi ụlọ ọrụ AMATAS dị n'Ọnịcha, na steeti Anambra.

O kwuru na ewezuga igwu ojoro, aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ nwere ezi ohere dị elu ituru ugo na ya bụ nhọpụta na-abịa n'ihu, n'ọnwa Nọvemba ahọ a.

Please Support this Project Today

Please consider supporting this project today with any amount. No amount is too small! Help us to continue to host and maintain this website for the promotion of the Igbo language and culture.

Amount:

Advertisement

Connect with us

Akuko Uwa

E Keela Otu Nwoke n'Osisi, Pia Ya Tọọ Tọọ Maka Ịkwaso Nwatakịrị Iko  n'Iké...

E Keela Otu Nwoke n'Osisi, Pia Ya Tọọ Tọọ Maka Ịkwaso Nwatakịrị Iko n'Iké...

Ụbọchị bụụrụ nnọọ otu nwoke e tie okwe e rie oke n'isi ngwụcha izu ụka gara aga dịka ụmụ okorobịa iwe juru obi kere ya agbụ, wụọ ya agbara aka n'ahụ ma were ụtarị pịa ya tọọ tọọ maka ịkwaso nwata gbara naanị ahọ asaa.

Mba China Ga-Arụnye Ụlọ Ọrụ Ukwu n'Ọnịtsha...

Mba China Ga-Arụnye Ụlọ Ọrụ Ukwu n'Ọnịtsha...

Ụlọ ọrụ mba China, bụ ụlọ Golden Promise egosipụtala mmasị ha iwunye ụlọ ọrụ ukwu n'Ọnịtsha nke steeti Anambra. Ụlọ ọrụ ahụ, bụ nke jikọrọ aka ọnụ ya na ụlọ ọrụ China Communication Construction Company na ụlọ ọrụ Inland Water Ways Authority gosipụtara ma kwupụta mmasị a n'ọbịbịa ga bịara izute ọchịchị steeti ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka, bụ ebe aka na-achị steeti ahụ nọrọ wee nabata ha.

A Dụọla Ndị Ọrụ Ahụike Ka Ha Dị Uchu n'Ọrụ Ha...

A Dụọla Ndị Ọrụ Ahụike Ka Ha Dị Uchu n'Ọrụ Ha...

A kpọkuola ma dụọ ndị ọrụ ahụike ka ha gaa n'ihu n'itinye uchu n'ọrụ ha ma werekwa ya dịka ọkpụkpọ òkù iji wee mee ka mma ọrụ ha pụtawanye ihè.

Ndị Okpokò Ahọpụta Ndị Ndu Ọhụụ, Bie Nsogbu Ịzọ Ọkwa Ọchịchị n'Obodo ahụ...

Ndị Okpokò Ahọpụta Ndị Ndu Ọhụụ, Bie Nsogbu Ịzọ Ọkwa Ọchịchị n'Obodo ahụ...

Ọñụ dara nnọọ n'obodo Okpoko nke dị n'okpuru ọchịchị Ọgbaru nke steeti Anambra dịka ndị obodo ahụ nupụtara n'ìgwè wee họpụta ndị ndu ọhụụ, bụkwazị nke mere ka nsogbu ahụ gbagoro ahọ iri na otu n'obodo ahụ banyere ịzọ ọkwa onye ndu, bịa n'isi njedobe.

E Toola Obianọ Maka Iji Ụgbọala Nọchi Anya Ọkada...

E Toola Obianọ Maka Iji Ụgbọala Nọchi Anya Ọkada...

Ofu òtù a maara dịka "APGA Media Warriors" etoola aka na-achị steeti Anambra bụ gọvanọ Willie Obianọ maka nkwa ahụ o kwere iji ụgbọala wee dochie anya ọkada n'Akwa nakwa Ọnịsha, bụ ebe o kwuru na ndị ahụ ji ọgba tum tum akpa ego agaghị agbazịkwa na ya malite n'abalị nke mbụ n'ọnwa Julayị ahọ a.

Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ n'Ọnịsha, Mee Mkpamkpa n'Okpoko...

Ide Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Anọ n'Ọnịsha, Mee Mkpamkpa n'Okpoko...

Nnukwu ihe egwu dara nnọọ n'Ọnịsha, steeti Anambra, n'izuụka gara aga, dịka oke idè mmiri gbàgburu mmadụ anọ ndị ọrụ ụlọ akụ ma tigwosiekwa ọtụtụ ụgbọ ala, n'ihi ike mmiri ozuzo kwọsịrị n'obodo ahụ, bụkwa nke zoro ọtụtụ awà.

AKUKO SI MPAGHARA AMERIKA

AKUKO SI MPAGHARA YUROPE NA ESHIA

Igbo Language Resources

Contact Us

4800 Gordon Road
Grasslands PO Box 40026
Regina, SK, Canada S4W 0L3
Tel:+1.306.581.4493
Email: igbo@igboradio.com

Copyright © 2009 - 2018 Igbo Radio & The Foundation for the Promotion of Igbo Language and Culture. All Rights Reserved! Designed & Powered by SITE FATHER.