Top Stories

Grid List

Igbo sị na ọ na-abụ onye zoro ezoro gafee, e zoro ezoro chụba ya. N'ịgbaso nke a, o mere ndị mmadụ vam n'anya na nso nso a, dịka ndị ọrụ nchekwa na steeti Anambra gbachibìdòrò ma nwụchie ótù nnukwu ụgbọala si na steeti Plateau dị na mpaghara mgbago ugwu ala Nigeria wee buru ndị mmadụ na-abata n'ime steeti ahụ (Anambra), na-agbanyeghị na gọọmenti nyere iwu ka e mechigodi ókè ala steeti niile ugbua n'ihi ọrịa nje korona.

Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela atụmatụ mmiri ọñụñụ mpaghara Otuọcha, bụ nke a maara dịka 'Otuocha Regional Water Supply Scheme'.

Nnekwu ọkụkọ sị na ọ bụ ihe o nwere ka o ji emere okeọkpa ọgọ, ebe ndị Igbo sị na ọ na-abụ a nyụkọọ mamịrị ọnụ, ọ gbaa ụfụfụ. Ka ọ dị taa, n'iji sị ya jisie ike, otù ụlọọrụ ngo mba China ejirila ihe erimeri dị iche iche wee kwàdo gọọmenti steeti Anambra n'agha ahụ ọ na-ebu megide ọrịa nje korona nà mmetụta ya dị iche iche n'ebe ụmụafọ steeti ahụ nọ.

Ka ọ dọchara aka na ntị ọtụtụ oge bànyere nke ahụ, gọọmenti steeti Anambra amalitela ịkụtùsì ụlọ/ọdụ ahịa na ihe ndị ọzọ dị iche iche a rụrụ n'ebe ekwesighị ekwesi na steeti ahụ.

Igbo sị na ọ bụ ụkwụ ka e ji achọ ihe dara mmiri, ma sịkwa na ọ na-abụ e gbuo àhàmà, a bụghị ya n'ukwu, o puchie.

Ụlọ ọba ego 'First City Monumente Bank' (FCMB) nọrọ na nso nso a wee bunye gọọmenti steeti Anambra akpa osikapa ruru narị asatọ na iri ise, iji kwàdo ya n'agha ahụ ọ na-ebu megide mgbasa ọrịa nje korona nakwa mmetụta nke oge ọrịa ahụ n'ahụ ụmụafọ steeti ahụ.

Igbo sị na onye na-amụ iti ọkpọ buru ụzọ tie akpa aja tupu ọ chọwa onye ọ ga-etigbu. Ya were bụrụ ihe kọwara otu nwa amadị a, bụ Anthony Joshua, siri tichaa akpa àjà ma tigbue Andy Ruiz Jr, na asọmpi ha abụọ nwere.

Goolu abụọ sitere n'aka Victor Osimhen na goolu nke Alex Iwobi na Samuel Chukwueze nyere wetara Naijiria mmeri ha meriri mba Lesotho site na ọkpụ goolu anọ asatara abụọ na Ntozu maka Iko Mba Afrịka, AFCON, n'afọ 2021 nke otu L agbara ụbọchị ụka n'amaegwuregwu Maseru.

Okaibe, Naijiria, agbaala ọnyụpa na AFCON ndị erubeghị afọ iri abụọ na atọ na-aga n'ihu ugbua na Ijipt dịka ha na ndị mba Saụt Afrịka gbara onwe ha onye laba onye laba n'amaegwuregwu Al-Salam dị na Cairo, Ijipt, ụbọchị Fraịdee. Mpụtara asọmpi ahụ ezughị ime ka ha banye n'agba nke na-eso agba nke ikpeazụ.

Ugo Ukwu nke Naijiria nọrọ n'amaegwuregwu Godswill Akpabio dị na Uyo were gosi Uze Benin na ha ka na-amụ amụ n'ebe egwu bọọlụ dị. Ugo Ukwu jiri ọkpụ abụọ asatara nanị otu were merie Uze na asọmpi nke otu L maka ntozu nke iko Afrịka.

Dịka ọ na-ahịọ na mba Ijipt ebe AFCON ndị erubeghị afọ iri abụọ na atọ na-aga n'ihu ugbua, Naijiria jiri iwe were gosi mba Zambia na ọ bụ iti na-ama ụzọ akwụkwọ ka ha jiri ọkpụ atọ asatara otu si ha jido n'amaegwuregwu Al Salam na Cairo.

Dịka asọmpi maka ntozu AFCON na-ebiri ọkụ, otú egwu bọọlụ ala anyị, Ugo Ukwu, bụ ndị a na-eche na ha ga-ezukọta na Naijiria, ụbọchị taa bụ Mọndee iji were kwado maka asọmpi a iji sonye na AFCON 2021. Asọmpi mbụ nke otu B dị n'etiti Naijiria na ndị mba Benin Republic.

Igbo sị na omepùru nwa ogbenye na-emepùru chi ya; ma sịkwa na ọ bụ o jide o nye ka ọha mmụọ na ọha mmadụ na-ekwupùru. N'ịgbaso nke a, òtù ahụ jikọtara ndị onowu na steeti Anambra, bụ òtù a maara dịka 'Anambra State Council of Traditional Rulers' agbaarala ndị ụwa na-atụ n'ọnụ na steeti ahụ ekeresimeesi, site n'ikesà ọtụtụ ihe onyinye, nke gụnyere ego na akpa osikapa nyegara ha nà òtù ọrụ obi ebere ndị ọzọ dị iche iche sitere okpuru ọchịchị iri abụọ na otu nke steeti ahụ nàkwa mpụga ya.

Isi ọchịchị ụwe ojii ala anyị ekwela ndị Anambra nkwà ezi nchekwa na gburugburu niile nke steeti ahụ tupuu, mgbe a na-eme, nakwa mgbe e mèchara mmemme ekeresimeesi a.

Obodo dere jim jim ugbua n'ime obodo nsukka nke dị na Steeti Enugwu kamgbe ụbọchị Mọndee dịka otu onye ụkọchukwu ụka Katọlik, Malachy Asadu, bụ onye nke a chọrọ, o were bụrụ ndị ntọ akparala ya aka.

Agba nke abụọ nke atụmatụ Operation Kpochapụ, bụ nke a gbàpèrè nso-nso a site n'aka Gọvanọ Willie Obianọ na-achị steeti Anambra, ka na-aga n'ihu na-amịtawanye mkpụrụ ọma, ma na-adọtawanye ọtụtụ akụkọ ọgbụgba àmà dị iche iche.

Igbo sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị, ma sịkwa na ọ na-abụ a na-egbu ji awaị, ọ na-atọ ụtọ, a na-abachawanye ji. Ka ọ dị taa, ndị uwe ojii steeti Anambra akpụgharịala ndị a na-enyo ènyò na ha bụ ndị omekoome, dị iri asaa na otu n'ọnụ ọgụgụ, bụ ndị a nwụchikọrọ site na mpaghara ebe dị iche iche na steeti ahụ.

Mkpu akwa dàrànnọọ n'obodo Ụmụokpu dị n'ikpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra, dịka ọkụ ọgbụgba dabìdòrò ma gbaa otu nnukwu ụlọ pịa-pịa. Ya bụ oke ọkụ bụ nke a na-enyo ènyò na ọ bụ nsogbu sitere n'ọkụ latiriiki kpàtàrà ya, ma bụrụkwa nke gbara ya bụ ụlọ gwòògwòò, tinyere ọtụtụ ngwongwo dị n'me ya, nke gbúru nde kwùru nde Naịra.

Top Stories

Grid List

Dịka a nà-atụ anya na eluigwe nwèrè ike ibe ákwá nke mbụ ya n'ime ahọ a oge adịghị anya, anya mmiri ya ewee gbaa n'ụwa; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra ka ha kwụsị iji ahịhịa asụchisi ọwà mmiri, maka ajọ ọnọdụ dị iche iche nke ahụ aghaghị iwèta.

Ndị obodo Ojoto dị n'okpuru ọchịchị 'Idemili South' agbapeela okporo ụzọ ọhụụ ha rụrụ, bụ nke na-azabụ okporo ụzọ St. Barnabas, ma bàgharịzie ya aha ka ọ bụrụzie okporo ụzọ "Eze Oranyelu''.

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ nso-nso a dịka ndị ògìgè 'Idemili Cultural Centre' dị n'Ụmụowelle Agụlụ, n'okpuru ọchịchị steeti Anaọcha nke steeti Anambra mèrè emume ịgba ọfala. Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'isi ogìgè ndị òtù ahụ ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ụmụafọ obodo ahụ.