Iju Mmiri Agbàgbuola Mmadụ Isii n'Anambra

 Izunna Okafor dere akụkọ a

Anyammiri zòrò ka mmiri na nsonso a n'obodo Nzam dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra West nke steeti Anambra, dịka iju mmiri gbàgbùrù mmadụ isii bụ ndị otu ezinụlọ n'ime ụlọ ha.

Nke a bụ nke dapụtara ka ọ gachara ihe dị ka abalị olenole ọtụtụ mmadụ jiri nwụọ oge ụgbọ mmiri kpùrù n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru dịkwa na steeti ahụ, oge o bu ụfọdụ ndị mmadụ iju mmiri ahụ tokpòrò wee na-aga ebe ọzọ.

Dịka ihe vidio na-efegharị ugbua n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ siri kwuo, iju mmiri ahụ gbàgbùrù ndị ahụ n'ime ụlọ ha ka ha mèchàrà nkwadobe maka ikwapụ̀ n'ụlọ ahụ, tupu iju mmiri ahụ wee too, zachakọrọ ha ma gbagbuo ha. 
Otu onye ọnọmgbeomere kọwàrà na mmadụ isii ahụ gụnyèrè otu nwaanyị, ụmụ ya anọ na na otu nwanne ya nwanyị.

Vidio ahụ gòsìkwàrà ka ndị ntorobịa ahụ na-ebupụ̀tasịkwa ozu ndị ahụ n'ụlọ ha ebe iju mmiri gbàgbùsiri ha, ebe ọtụtụ ndị mmadụ nọkwa ebe ahụ na-ebe akwa maka ajọ ọdachi ahụ nà mkpamkpa ndị ọzọ iju mmiri ahụ na-akpa n'obodo ahụ na ụfọdụ ebe ndị ọzọ n'ime steeti ahụ.

Ọ dị ncheta na iju mmiri emeela ọtụtụ mkpamkpa dị icheiche na mpaghara ọtụtụ obodo n'ime steeti ahụ, bụkwa nke ọchịchị steeti ahụ na ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ mberede n'ime steeti ahụ bụ Anambra State Emergency Management Agency (SEMA) na ọtụtụ òtù na ụlọọrụ dị icheiche agbaala mbọ ma nyekwa aka n'ọtụtụ ụzọ dị icheiche iji zọpụta ma nyere ndị ọnọdụ ahụ metụtara aka.

Gọọmenti steeti ahụ nọkwàrà nsonso a wee kesaara ndị bi na mpaghara ahụ ihe na-enye aka izọpụta onye mmiri na-eri, bụ ‘life jacket’, iji nyere ha aka ịgbanahụ ọnọdụ mberede.

N'ihi ajọ ọnọdụ, mmetụta ọjọọ na ihe ụfụ dị icheiche ọ na-ewetara ha, ụmụafọ obodo dịgasị na mpaghara ahụ akpọkuola gọọmenti steeti ahụ, gọọmenti etiti, nà òtù mba ụwa dị icheiche ka ha welitekwuo aka n'otu ha si agbatara ha ọsọ enyemaka.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, onyeisi ọchịchị obodo Anaku dị n'Ayamelum, bụ Maazị Paul Nwuba kọwàrà na ya bụ iju mmiri bụ nke na-awa kwà afọ ọbụla, ma kpọọ òkù ka a chọọ ihe a ga-eme banyere ya bụ ajọ ọnọdụ, iji wete ọdachi ahụ n'isi njedobe ebighebi, karịa ịbụ ọnọdụ ga na-ewetara ha ihe ịkwa arịrị na ihe ịta ikikere eze kwà afọ ọbụla.

Ọ kpọrọ òkù ka e zitere ha ụgbọ mmiri ngwangwa iji zọpụta ndị nke ya bụ iju mmiri tokpòrò, ma kpọkwa òkù ka e zitere ndị ọnọdụ ahụ metụtara ihe oriri na ihe enyemaka ndị ọzọ, iji belatara ha agụụ na ihe isi ike ha na-agabiga n'oge a n'ihi iju mmiri ahụ.

Onye ọzọ e jikwa okwu ya agba izu n'Ayamelum, bụ Maazị Innocent Onyigbo mèrè ka a mara na ya bụ iju mmiri wakpòrò ha na mberede, nke na ọ wara oge ha atụbaghị anya. Ọ kọ̀kwàrà akụkọ banyere otu ya bụ iju mmiri siri tokpò ma bibisie ihe ha kọrọ n'ugbo, ọbụna dịka ọ rịọrọ enyemaka ego na ihe ndị ọzọ iji kwụrụ chịm n'oge ọdachi a. 

Onye ọzọ bụkwa onye ọrụ ugbo na mpaghara ahụ, bụ Maazị Ogugua Ikechukwu kwùrù na ha ji maka iju mmiri ahụ wee wèé ihe ubi ha n'erughị eru, ka mmiri ahụ wee ghara ibibicha ha niile, maka na ọ na-adị mma na ọ na-adị mma kama agwọ ga-agbafù e gbubiri ya ọdụ.

O tinyèkwàrà ọnụ we rịọ gọọmenti n'ogoogo dị icheiche ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka na ya bụ ọnọdụ akarịala ha ma na-emekpàzị ha ahụ nke ukwuu ugbua.