Igwe Chidume agbaala ofala n'ụzọ pụrụ iche

Dec 25, 2022 - 07:03
 0
Igwe Chidume agbaala ofala n'ụzọ pụrụ iche

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ kpọtụrụ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a n'obodo Omor dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ayamelum nke steeti Anambra, dịka eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Oranu Chidume mèrè emume ịgba ọfala ya n'ụzọ pụrụ iche, bụkwa nke o jiri merùbe afọ ise o jiri banye n'ọkwa dịka eze ọdịnala obodo ahụ.

Ya bụ oke mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'òbí eze ọdịnala ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ụmụafọ obodo ahụ, ndị òtù dị icheiche, ndị ichie na ọtụtụ ndị ọzọ sikwa ebe dị icheiche wee bịa isonye na ya.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Igwe Chidume kwupụtàrà obi ụtọ ya, ma nyekwa Chineke ekele maka ọrụ ọma dị icheiche o ji ya arụ n'obodo ahụ kemgbe afọ olenole gara aga, ma kelekwazie ụmụafọ obodo ahụ maka ezi nkwàdo ha na ekpere ha nyegara ọchịchị ya, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ha ka ha gaa n'ihu ime nke ahụ.

O mere ka a mara na obodo ahụ bụ ndị na-akọsi ọrụ ugbo ike, bụkwa nke e jiri mara ha n'ụwa gbaa gburugburu, tinyere omenala na ọdịnala dị icheiche e jiri mara ha, nke ha sikwa na ha wee na-akwalite ọnatarachi na njirimara ndị Igbo 

Dịka ọ na-akpọpụ̀tasị ụfọdụ ihe dị icheiche ndị obodo ahụ jikọgoro aka ọnụ wee mepụta iji kwalite mmepe na ọdịmma obodo ahụ; ọ gàkwàrà n'ihu wee kwuo na ọ gaghị ada mbà inye ụmụafọ ahụ ezi ọchịchị bụ ịgbà site n'inye aka ha, nkwàdo nà ekpere ha. O kwukwàrà na ha na-etinyezị anya ugbua n'ihe gbasara ịkwàlite agụmakwụkwọ, ọkachasị agụmakwụkwọ ụmụaka ụmụnwaanyị.

Ya bụ eze ọdịnala gàkwàrà n'ihu kelee Chineke maka ichekwaba na idu ụmụafọ obodo ahụ n'ogologo oge niile nke afọ a, ha wee na-apụ, na-abata, ma na-agawanye n'ihu, na-emekwa nke ọma na ngalaba dị icheiche, wee hụkwa ọnwa ikpeazụ n'afọ a.

N'okwu ha n'otu n'otu, Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uchenna Okafor; eze ọdịnala obodo Aguleri, bụ Igwe Michael Idigo; na Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị, bụ Oriakụ Ify Obinabo kèlèrè eze ọdịnala obodo ahụ maka ezi ọchịchị ya, kelekwa ya maka ihe dị icheiche pụtara ìhè ọ ya na ndị obodo ya na-eme iji kwalite omenala Igbo na ọdịmma ụmụaka ụmụnwaanyị. Ha kpekwazị̀rị̀ ka Chineke gaa n'ihu ịgọzi na inye ya amamihe iji na-edu obodo ahụ etu kwesiri ekwesi.

Ọtụtụ ndị ọzọ sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe; nwunye aka chịbụrụ steeti Anambra, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obiano tinyéré ọtụtụ ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ nà mpụ̀ga ya.

A nọkwàrà na ya bụ mmemme rie, ṅụọ, gbaa egwu ọdịnala, ma mekwa ọtụtụ ihe ngosi dị icheiche mere ka anya na ọnụ ǹụ̀rịa.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484