IGP Akali etoola Soludo, gbapee ogige ndị uweojii ọhụrụ n'Anambra

Dec 25, 2022 - 07:23
 0
IGP Akali etoola Soludo, gbapee ogige ndị uweojii ọhụrụ n'Anambra

Iznnna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi ndị uweojii n'ala Nigeria, bụ IGP Usman Alkali Baba nọrọ na nsonso a wee wụchaa na steeti Anambra maka ịgbape ogige ndị uweojii a rụrụ ọhụrụ n'Amawbia dị n'okpuruọchịchị ime obodo Awka South nke steeti ahụ.

Ya bụ Onyeisi uweojii, oge ọ wụchàrà na steeti ahụ, bùrù ụzọ gaa kpọtụrụ aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Charles Soludo n'ebe obibi ya dị n'Amawbia, bụkwa ebe ọ nọrọ wee tòó ya maka nkwàdó dị icheiche ọ na-enye ndị uweojii na steeti ahụ iji rụọ ọrụ ha nke ọma, ọkachasị dịka o siri metụta ibu agha megide ndị omekome na steeti ahụ.

N'okwu ya oge ọ na-agbape ogige ọhụrụ ahụ, IGP Akali kwùrù na ebumnobi e jiri rụọ ya bụ iji kwalite arụmọrụ ndị uweojii ahụ ma nyekwa ha ezi ọnọdụ na ebe obibi dị mma maka ịrụ ọrụ ha, tinyéré ebe ha ga na-ezu ike ma ha rụchaa ọrụ.

Banyere ajọ ọnọdụ nchekwa steeti ahụ, ya bụ Onyeisi ndị uweojii kọwàrà na ajọ ọnọdụ nchekwa bụ ihe zuru ụwa ọnụ, ma gbarụọ ihu banyere atụmatụ ndị òtù ‘Indigenous People of Biafra (IPOB)’ na-akpa na mpaghara ahụ, kwuo na ha agaghị anabata ụdị ihe ahụ chaachaa, maka na ha na-eme ya n'ụzọ ekwesighị ekwesi na n'ụzọ iwu akwadòghị.

O kwùrù na ụlọọrụ ya ga-agbasi na-etinyesi atụmatụ n'ọrụ ugbua ma na-agbasikwa mbọ ike ịhụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa bụ ịgba n'ala Nigeria, iji hụ na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n'afọ na-abịa abịa ga-aga siriri-werere, n'enweghị ihe mkpọbì ụkwụ ọbụla. 

Na ntụnye nke ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo, nke onye nọchitere anya ya n'oge mmemme ahụ bụ Onye Enyemaka Pụrụ Iche Nye Gọvanọ n'Ihe Gbasaara Nchekwa, bụ Maazị Ben Chiobi kelere IGP Akali màkà ịhụ na Anambra sò na ndị ritere uru n'ụdị ọmarịcha agadaga ọrụ ahụ, tinyéré nkwàdó ya na ntụnye ndị ọzọ ọ na-enye iji hụ na e nwere ezi ọnọdụ nchekwa na steeti Anambra. O kwezịrị nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịkwàlite ezi ọnọdụ nchekwa na steeti ahụ.

Na mbụ n'ozi nnọọ ya, Onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ Maazị Echeng Echeng nyèrè nkọwa banyere etu ọnọdụ nchekwa siri gbata kwụrụ na steeti ahụ, kelee ọchịchị steeti Anambra na IGP Akali màkà nkwàdó ha, ma kpọpụtasịa ihe iche aka mgba dị icheiche na-akpa ha, na ihe ha na-agabiga n'arụmọrụ ha. Ọ rịọkwazị̀rị̀ Onyeisi uweojii bụ IGP Akali ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihe ndị ahụ na-akpa ha, iji kwalite arụmọrụ ha.

Ụfọdụ ndị ọzọ dị icheiche sonyere na mmemme ahụ gụnyèrè onye jigodi ọkwa dịka eze ọdịnala ugbua n'Amawbia, bụ Emeka Mmaduka; Igwe Romanus Iloh nke Nise, tinyere ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484