Gọvanọ Soludo Ekwenwòólá Nkwa Ịkwàlite Ọkụ Latirik n'Anambra

Gọvanọ Soludo Ekwenwòólá Nkwa Ịkwàlite Ọkụ Latirik n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwunwòólá na ọchịchị ya nwere ezi mmasị n'ịkwàlite ọdịmma steeti ahụ na ụmụafọ ya, site n'ịhụ na ihe dị icheiche e ji enyere ndụ aka na ihe na-akwàlite mmepe na ọdịmma obodo akọghị ụkọ na steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a ụbọchị Wenezdee n'okwu ya na mmemme ịtọ okwute ntọala maka ịrụ ogige ọkụ latirik bụ ‘power station’ ike ya ruru 132KV n'Aguleri, dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra East.

N'okwu ya na mmemme ahụ, nke weere ọnọdụ n'Umuekete Igboezulu Aguleri, Gọvanọ Soludo, nke ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ọkụ na mmiri na steeti ahụ, bụ Injinia Julius Chukwuemeka  nochitèrè anya ya n'ebe ahụ mèrè ka a mara na ogige ahụ ga-enye obodo dịgasị na mpaghara ọgbọ nta nkwàdó ‘Anambra North’ ọkụ n'ùjú.

O mere ka a mara na nke ahụ bụ mmezupụ̀ta otu n'ime nkwà o kwèrè banyere ịkwàlite ọkụ latirik na steeti ahụ, bụkwa nke pụtabagoro ìhè na nsonso a. O kwuru na ọ nweghị Mega Waatị ọkụ latirik ọbụla a na-emepụta n'ime steeti ahụ ugbua, ma kọwaa na steeti ahụ ga-ebido imepụta ọkụ, site n'aka ndị nnọrọonwe.

Ọ dụkwazịrị ndị obodo ahụ ọdụ ka ha chekwaba ma lekọta akụrụngwa ahụ na ihe ndị ọzọ dị icheiche gọọmenti rụrụ na mpaghara ha anya nke ọma, iji hụ na ndị omekome ebibighị ya maọbụ zukọsịa ihe dị na ya.

Ụfọdụ ndị ọzọ dị icheiche sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè eze ọdịnala Aguleri, bụ Igwe Micheal Idigo; onyeisi ‘Enugwu-Otu Aguleri Development Union’, Maazị Nnamdi Adimora; onyeisioche Umuekete Igboezunu Aguleri, Maazị Chinedu Mmadubueze; onye ji ọkwa dịka ‘Senior Manager’ n'okpuru ngalaba ‘Protection, Control and Maintenance’ nke ụlọọrụ ‘Transmission Company of Nigeria’ bụ Injinia Chinedu Ifeatu; tinyéré Injinia Chinwendu Anyanwu bụ onye Kọntraktọ̀ ụlọọrụ ‘Cinnac Ventures Limited’ ji ọrụ ngo ahụ.