Gọvanọ Soludo Ebinyela Aka n'Amụ̀mà ego Ọrụ Anambra

Gọvanọ Soludo Ebinyela Aka n'Amụ̀mà ego Ọrụ Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a


Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Charles Chukwuma Soludo, ebinyela aka n'akwụkwọ ámụmà ego ọrụ ahọ 2022 a hazigharịrị ahazigharị na steeti ahụ, bụ nke ọnụ ego ya dị ijeri naịra otu narị na iri asaa (₦170bn).

Ya bụ ámụmà ego ọrụ, nke a kpọrọ "Building Off from the Blocks" bụ nke Gọvanọ Soludo binyere aka na ya na mmemme pụrụ iche weere ọnọdụ n'obi gọọmentị dị n'Awka.

N'okwu ya oge ọ na-ebinye aka n'ámumà ego ahụ, Gọvanọ Soludo tòrò ndị ụlọ omeiwu maka ịdị uchu ha, etu ha si eme ọmarịcha iwu na-enye aka n'ịkwàlite mmepe na ọganihu obodo, ya na etu ha si anọchite anya ụmụafọ steeti ahụ nke ọma n'ụlọ omeiwu steeti Anambra. O mèkwàrà ka a mara na e nwere ezi mmekọrịta siri ike n'etiti ọchịchị ya na ndị omeiwu steeti ahụ na ngalaba ọchịchị ụlọọrụ gọọmenti ndị ọzọ.

Ọ gara n'ihu kwupụta ezi njikere na mkpebi ọchịchị ya dị iji ego ndị Anambra wee rụọ ọrụ nke ọma ma kwàlité mmepe obodo na ọdịmma ụmụafọ steeti ahụ.

Ya bụ mmemme dọtàkwàrà ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ, ma ndị isi ọchịchị ma ụfọdụ ndị omeiwu steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

Ọ dị ncheta na Gọvanọ Soludo nọrọ n'ime ọnwa Mee ahọ a wee ziga ámụmà ego ọrụ ahọ 2022 e degharịrị edegharị n'ụlọ omeiwu steeti Anambra, nke nwere ndenye ego ruru ijeri naịra otu narị na iri asaa (₦170bn).

N'okwu ya oge ọ na-agupụ̀tara ndị omeiwu nkọwa ámụmà ego ọrụ ọhụrụ ahụ, o mere ka a mara na pasentị iri isii na anọ n'ime ego ọrụ ahụ bụ màkà ọrụ mmepe obodo; ma kọwakwa na a hụtara mkpa ọ dị ịhazìgharị̀ ego ọrụ ahụ n'ihi etu ọnọdụ akụnụba nà ọnụ ahịa ihe siri dị ugbua.

Ọ kọ̀wàkwààrà ha ihe ndị ọzọ ha kwesiri ịma banyere ya bụ ámụmà ego ọrụ a hazigharịrị ahazigharị, ma kwe nkwa na a ga-enwe ezi mmekọrịta n'etiti gọọmenti na ndị ọrụ omeiwu steeti ahụ.