Gọvanọ Soludo Dị Njikere Ịkwàlite Ngalaba Ahụike —Kọmịshọna Obidike

Gọvanọ Soludo Dị Njikere Ịkwàlite Ngalaba Ahụike —Kọmịshọna Obidike


Nkechi Ikenwoke

Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti Anambra, bụ Dọkịta Afam Obidike ekwupụtala ezi njikere aka na-achị steeti ahụ bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo dị ịkwàlite ezi ọnọdụ ahụike ụmụafọ steeti ahụ.

Dọkịta Obidike kwuru nke a n'Amanuke di n'okpuruọchịchị ime obodo Awka North oge o so ndị òtù Rotary International Action Group nke Austria wee gaa njem nleta n'ụlọ ahụike dị ebe ahụ.

N'okwu ya n'ebe, ọ kọwàrà na ọchịchị steeti a na ngalaba ụlọọrụ ahụike ga-ejikọ aka ọnụ ma gbaa mbọ maka nkwalite ụlọ ahụike dịgasị na steeti ahụ.

Dọkịta Obidike gara n'ihụ kwuo na ọchịchị Ọkammụta Soludo ga-adọta ndi e ji okwu ha agba izu, na ndi mba ofesi na ahụ maka ọrụ nhazi ezinụlọ nà ịkwalite ụlọ ahụike maka ọdịmma ndi Anambra.

Ọ sị, "Òtù a chọrọ inye aka ma belata oke ọnwụ na-adapụta n'etiti nne na nwa, rụọ ọrụ nhazi ọmụmụ nwa (family planning) nakwa igbochi ọrịa ịba. Anyị agaala njem ihụ maka ngwaọrụ n'okpuruọchịchị atọ dị na steeti a.”

N'okwu nke ya, onyeisi otu ahụ bụ Ọkammụta Peter Neuner kwùrù na ọ bụ mmasị ha isoro ọchịchị steeti Anambra maka imezupụta ebụmnobi ha.

Ọ sị "Anyị mere ya na steeti Enugu. Anyị chọkwara ime ya na steeti a. Ebumnobi anyị gunyere ibelata oke ọnwụ na-adapụta n'etiti nne na nwa, ihazi ezinụlọ, igbochi ọrịa ịba nakwa ibute ngwaọrụ ahụike."

Ndi ọzọ so n'otu a nọkwazị oge ahụ gụnyèrè ndị nelekọta otu ahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ,  Eric Igweshi, Uju Manafa-Nwume, na ụfọdụ ndị ọzọ.

Ụlọ ahụike ha gara ụbọchị ahụ gunyere Enugwu-Ukwu General Hospital, dị n'okpuruọchịchị Njikoka; Comprehensive Medical Centre, Awkuzu, dị n'okpuruọchịchị Oyi; General Hospital Amanuke na Primary Healthcare Centre Amanuke, dị n'okpuruọchịchị Awka North.