Gọọmenti Anambra ekpebiela ịkwụsị nsogbu ịzọ oke ala

Izunna Okafor dere akụkọ a
Ọchịchị steeti Anambra ekwupụtala mkpebi ya nà mmasị ya ịkwụsị oke ndapụta nsogbu ịzọ oke ala, bụ nke na-apụ̀takarị n'etiti obodo dị icheiche na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.
Osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim bụ ya kwupụtàrà nke a oge ọ gara itinye ọnụ n'okwu gbasara nsogbu oke ala ahu na-adapụta n'etiti obodo Abba, Ukwulu, na Ukpo, dịgasị n'etiti okpuruọchịchị ime obodo Njikọka na Dunukofia. Ya bụ esemokwu na nsogbu oke ala bụkwa nke dịbagoro kemgbe ọtụtụ qafọ ole gara aga.
N'okwu ya n'ebe ahụ, Dọkịta Ibezim dọrọ ndị obodo dị icheiche n'ime steeti ahụ aka na ntị banyere inwe nsogbu oke ala, ma kwuo na ọchịchị nọ ugbua na steeti ahụ, bụ ọchịchị Gọvanọ Chukwuma Soludo agaghị anabata ihe dị otu ahụ ma steeti ahụ chaachaa, n'ihi na ụdị ọnọdụ ogbaaghara dị otú ahụ na-adọghàchi aka elekere azụ n'ihe gbasara udo, idinotu, ọganihu, na mmempe ịbàta n'obodo. Ọ sị na ụdị nsogbu dị otu ahụ na-ewetekwa ọnwụ erughị eru, mbibi akụnụba na ọtụtụ nkwafu ọbara n'obodo.
Ọ gbarụ̀rụ̀ ihu banyere oké mbawanye nke ọnụọgụgụ nsogbu oke ala e nwegasịrị na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ; ma kwuo na ọchịchị Gọvanọ Soludo azọbànyego ụkwụ ikpezi esemokwu na nsogbu niile ahụ, n'ịgbasò mkpebi ụlọikpe tozuru etozu nà nkabi ha banyere nsogbu ndị ahụ. O kwukwàrà na gọọmenti agaghị anabata maọbụ leghara anya ihe maọbụ onye ọbụla ga-etinye ósò ná nsogbu ndị ahụ maọbụ mee ka ha na-agawanye n'ihu.
Ọ gwàkwàrà ndị obodo ọbụla na-enwe nsogbu oke ala na steeti ahụ ka ha gbaso ma rube isi na mkpebi gọọmenti na ụlọikpe n'okwu ahụ, ma gharakwa ịdị na-akwanye ya bụ nsogbu ọkụ, ebe gọọmenti na-eme ka e kpezie ekpezie.
Dọkịta Ibezim mekwazịrị ka a mara na gọọmenti na ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n'obodo Abba, Ukwulu, na Ukpo ga-enwe nzukọ banyere nsogbu oke ala ahụ tagoro akị dị n'etiti obodo atọ ahụ; ma kwukwa na ha ga-agbaso usoro ọbụla kacha mma kwere omume, iji wètá ya bụ nsogbu na njedobe.
What's Your Reaction?






