Gọọmenti Anambra Azọpụtala Ụmụaka Atọ A Kwasoro Iko n'Iké

Gọọmenti Anambra Azọpụtala Ụmụaka Atọ A Kwasoro Iko n'Iké


Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọment steeti Anambra eforola ntutu taa na ọ ga-ewelitekwu aka n'agha ahụ ọ na-ebu megide ịkwasò nwaanyị iko n'ike, ya na ichekwaba ikike dịịrị mmadụ, ọkachasị ikike dịịrị ụmụaka na steeti ahụ.

Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze n'ime steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo, bụ ya kwupụtara nke a n'isi ụlọọrụ ya dị n'Awka oge ọ na-anabata ụmụaka atọ a kwasoro iko n'ike na steeti ahụ na nsonso a.

Umụaka atọ ahụ bụ ndị gbara naanị ahọ asatọ, ahọ iri na anọ, na ahọ iri na ise; ma bụrụkwa ndị sitere obodo Ifitedunu, Agulu na Ozubulu n'otu n'otu.

Nwata ahọ asatọ ahụ (bụ onye Ifitedunu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Dunukofia nke steeti ahụ) ka e kwuru na ọ bụ onye o bi be ya, bụ Maazị Victor Gbajie kwasoro ya iko n'iké.

Ya bụ nwata, onye ọ bụ nnukwu nne ya duru ya wee bịa na nke Kọmishọna Obinabo, nọ̀kwazị̀ ugbua anara ọgwụgwọ n'ụlọ ahụike ‘Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University Teaching Hospital’ dị n'Amaku Awka, n'ihi ụdị mmerụahụ dị icheiche o nwetere oge ahụ a na-akwaso ya iko n'iké, bụkwa nke nnyocha e megoro ugbua na-akọwa na ya bụ ihe metụ̀tara akụrụ ya.

N'aka nke ọzọ, nwata nke ahụ gbara ahọ iri na anọ (bụ nwaafọ steeti Abịa, ma biri n'obodo Agulu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anaọcha nke steeti ahụ) ka e kwuru na a mara ya elu n'íké, wee merụsịchaa ya ahụ oge a na-akwaso ya iko n'iké, mgbe ọ gara irere nne ya akara.

Ọ kọwàrà na nwoke ahụ kwasoro ya iko n'iké (bụ́ onye agbataobi ha) kpọrọ ya ka o wetere ya akara; ma kwuzie na akụkọ gbanwere oge ọ gara inye ya akara ahụ ọ chọrọ igo, dịka nwoke ahụ dakpòrò ya n'ike ozigbo, wee malite sụba ya akwụ. Ọ sịkwa na akwa niile ọ kwara na mkpu niile ọ na-eti ka ndị ndị mmadụ gbatara ya ọsọ enyemaka oge ahụ nwoke ahụ na-eme ihe ahụ bụ̀ nke amịtaghị mkpụrụ, n'ihi mkpọtụ si n'igwè ọkụ (generator) nwoke ahụ gbanyere.

Ọ bụkwa ụdị ọdachi ahụ dakwasị̀rị̀ nwata nke ọzọ (gbárá ahọ iri na ise ma bụrụ onye sitere Ozubulu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ekwusigo nke steeti Anambra), bụ onye otu nwoke bụ Oluchukwu Obi (gafegoro ahọ iri anọ) kwasoro iko n'iké oge ọ gara ụlọ ya ibujere ya nri o goro n'aka ha.

Ka ọ nụchara akụkọ niile ahụ banyere ihe ahụ ụmụaka ahụ gabigara, Oriakụ Obinabo katọ̀rọ̀ ya bụ ihe ma gbarụ̀ọ́ ihu banyere ụdị arụrụala dị etu ahụ.

Ọ nọrọ ebe ahụ kwuo na gọọmenti ga-ewelitekwu aka na ntaramahụhụ a na-enye ndị mere ụdị ihe dị etu ahụ, ndị na-emekpà ụmụaka ahụ, maọbụ ndị ọzọ na-emegide ikike dịịrị mmadụ n'ụdị ọbụla, maka na ọ bụrụ na a gbaghị ụzọ oweri mgba, ọ naghị echi.

Dịka ọ na-adụkwa ndị nne na nna na ndị nlekọta ụmụaka ọdụ ka ha na-akpachapụ̀ anya banyere ọdịmma ụmụaka ha; Kọmishọna Obinabo kwezịrị nkwà na gọọmenti agaghị ezu ike, rukwaa mgbe o nwetèèrè ụmụaka ahụ ikpe nkwụmọtọ site n'ịhụ na e kpere ndị ahụ rụrụ arụrụala ahụ ikpe ngwangwa ma nye ha ntaramahụhụ kwesiri ha. O kwukwàrà na e jidela ma kpọ̀chie ndị ahụ n'aka ndị uweojii ugbua.