Gọọmentị Anambra Akụtuola Ụlọ A Rụrụ Ebe Iwu Akwadoghị Na Nnewi

Gọọmentị Anambra Akụtuola Ụlọ A Rụrụ Ebe Iwu Akwadoghị Na Nnewi

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n'ofete nke ọzọ.

O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board' (ANSPPB) siri wee kụtuo ụfọdụ ụlọ a rụrụ n'ebe iwu akwdòghị n'Akwu Edoji, Uruagu, dị n'okpuruọchịchị Nnewi North nke steeti Anambra.

Ha bụ ụlọ bụ nke a rụchiri n'ebe okporoụzọ siri gaa, bụzị nke na-egbochi ndị mmadụ ịgafe ebe ahụ ma na-egbochikwa mmepe ọzọ ịbàtà mpaghara ahụ, n'agbànyeghị nnukwu obosara ala efu dị na mpaghara ahụ.

Ụlọ ahụ a kụtùrù gụnyere uloelu, ụlọala ụfọdụ ọnụzọ ama, aja ngwuru na ụfọdụ ụlọ ahịa, bụ nke ndị nwe ha rụgasịrị n'ebe ekwesighị ekwesi na n'ebe ụzọ gara. A hụkwara ákàrà ịdọ aka na ntị e jiri uhie mmee mmee wee degasịa n'ụlọ ahụ, nke gosiri na gọọmenti dọrọ ndị nwe ha aka na ntị oge ha bidoro ịrụ ya, mana ha aṅaghị ntị, ma gaa n'ihu nupu isi, ma rụrụ ọrụ na-aga.

Ndị òtù ọrụ gọọmenti gara kụtusịe ụlọ ndị ahụ bụkwazị nnukwu akụrụngwa katapila wee gaa ya bụ ọrụ, bụ nke ha jiri kụrụ ihe niile ahụ deberuo ala n'otu ntabi anya.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSPPB, bụ Maazị Chike Mmadueke kọwara nà n'agbànyeghị na ndị ahụ rụchisiri ihe ahụ ebe ekwesighị ekwesi, na ala ebe ahụ ha rụgasịrị ihe ahụ bụkwa ebe gọọmenti mapụtara maka ụdị ewumewu pụrụ iche, ma nwekwa eserese otu ewumewu ụlọ na okporoụzọ ga-esi gaa ebe ahụ, bụkwazị nke ndị mmadụ jigoro ịrụkàsị ụlọ wee mebisie site n'ịrụ ihe ebe ekwesighị ekwesi.

Ọ kọrọ akụkọ otu ụfọdụ ndị ahụ na-arụkasị ihe ahụ ebe ahụ siri wee tie ndị ọrụ ya ihe oge ha bịara ọrụ ịdọ aka na ntị ebe ahụ.
 
Dịka ọ na-eme ka a mara na ha ga-aga n'ihu ịkụtusi ihe ndị a rụgasịrị n'ebe ekwesighị ekwesi na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ; Maazị Maduekwe kọwara na ebumnobi ụlọọrụ ahụ abụghị imegide maọbụ imekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị etu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga na-arụzị ụlọ n'ebe ọbụla nà etu ọbụla ha chọrọ, bụ nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nà nke megidere ezi ebumnobi aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo bù n'obi n'ọrụ mmepe ọ na-abagide na seeti ahụ.

Ọ kpọkukwazịrị ndị na-arụ ụlọ ka ha na-akpachapụ anya ma gbaa mbọ na-enweta nkwàdo gọọmentị site n'aka ụlọọrụ gọọmentị na-ahụ maka nke ahụ, iji wee gbanahị ịkwa ngarammara n'oge ikpeazụ, maka na ajụghị ajụ wee rie na-ebute arịaghị arị̀à wee nwụọ.