Gọọmenti Anambra Agbapeela Mmalite Ọrụ Okporoụzọ Iteghete 

Sep 16, 2022 - 08:40
 0
Gọọmenti Anambra Agbapeela Mmalite Ọrụ Okporoụzọ Iteghete 

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra ekwupụtala njikere ya ịrụ ọtụtụ okporoụzọ ụzọ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ tupu ahọ 2022 apịachie akwụkwọ.

Aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo kwupụtàrà nke a oge ọ na-agbape mmalite ọrụ okporoụzọ ruru iteghete n'ọnụọgụgụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ.

Ọrụ okporoụzọ ụzọ bụgasị nke ọ gbapere ụbọchị Wenezdee na mpaghara Okpoko dị n'okpuruọchịchị ime obodo Ogbaru; ma bụrụkwa nke mgbakọta ogologo ya ruru kilomita 14.3.

Ha gụnyèrè: Okporoụzọ Obodoukwu—Owerri Road (5.77km), Okporoụzọ Oguagu- Ik Onuorah-Anumudu-Mgbua- Amazu-Owerri (2.97km), Okporoụzọ Edeh Road-School Road-Awalite - Ojoto-Owerri (1.48km) Okporoụzọ School Road- Umuobom Street-Ojoto Street Junction (0.58km), Okporoụzọ Umuobom street-Ojoto Street Junction-Adazi-Ani street-Owerri Road (0.77km), Okporoụzọ Umenweke-Umeojiakor (0.58km), Okporoụzọ Ojoto Junction-Anumudu (0.99km), Okporoụzọ Uzii Street - Mission Street (0.54km) na Okporoụzọ Anumudu Street - GMI Road (0.38km). 

N'okwu ya n'ebe ahụ oge ọ na-agbape ọrụ okporoụzọ ahụ, Gọvanọ Soludo kwùrù na nke ahụ so n'otu n'ime ihe dị icheiche o kwere nkwà ime ma ọ banye n'ọchịchị, bụ nke o kwupụtàrà mgbe ọ gara ịchụ nta nkwàdó n'okpuruọchịchị Ogbaru, wee hụ na ndị bi na mpaghara ebe ahụ na-ata ahụhụ, nke mezịrị o jiri kpebie na ọ ga-agbatara ha ọsọ enyemaka n'ụdị pụrụ iche ma kwalitekwa ọnọdụ mmepe Steeti Anambra n'izugbe ma ọ banye n'ọkwa.

Ọ kpọpụtasị̀rị̀ uru dị icheiche ezi ọnọdụ okporoụzọ bara n'ịkwàlite mmepe, ma kwe nkwà na a ga-arụcha ụzọ ahụ oge a tụrụ anya ma rụsikwa ha ike, nke na ha ga-anọkarị ahọ iri abụọ.

O kwuru na ọ ga-agbatịwanyekwa ọrụ ọma ahụ ruo na mpaghara ebe ndị ọzọ na gburugburu steeti ahụ, ọbụladị dịka ọ kpọkùrù ndị Anambra ka ha gaa n'ihu na-enye ọchịchị ya nkwàdó, ma zekwaara ime maọbụ itinye aka n'ihe maọbụ akparamagwa ọbụla ga-adọghachi aka elekere azụ n'ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484