FGN/IFAD-VCDP Enyela Ndị Mmadụ Ọzụzụ n'Anambra

FGN/IFAD-VCDP Enyela Ndị Mmadụ Ọzụzụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti etiti na steeti Anambra, site n'okpuru atụmatụ 'International Fund for Agricultural Development, IFAD assisted Value Chain Development Programme'
(IFAD-VCDP) enyekwuola ọtụtụ ndị mmadụ ọzụzụ n'ihe gbasaara ise onyoonyoo n'ime steeti Anambra.

Ya bụ ọzụzụ were otu ụbọchị bụ nke e mere n'ogige ụlọọrụ ‘Agricultural Development Programme’  dị n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara State ndị ọrụ ‘Extension Agents’ na ‘Laison Officers’ nke ngalaba Programme Management Unit (SPMU) sitere n'ime okpuruọchịchị asatọ na steeti ahụ.

N'okwu ya n'ebe ahụ, onyeisi nhazi ihe mmemme n'ụlọọrụ FGN/IFAD-VCDP, n'ime steeti Anambra, Maazị Nnamdi Agwuncha kọwara ebumnobi mmemme ahụ, ma kpọpụtasịkwa ọtụtụ uru dị icheiche ọzụzụ ahụ ga-eweta, bụ nke o kwuru na ọ ga-enyekwa aka n'ụzọ pụrụ iche n'ịkwàlitè mmepe obodo, nke bụ otu n'ime ebumnobi atụmatụ ahụ.

O mere ka a mara ụfọdụ ihe dị icheiche atụmatụ FGN/IFAD-VCDP mepụtagoro kemgbe mmalite ya n'ahọ 2014, ma gbakwa akaebe na ọtụtụ ndị mmad esitela n'ihe mmemme na nkwàdo dị icheiche atụmatụ ahụ na-enye wee baa ọgaranya n'ụzọ dị icheiche ma bụrụkwa ndị e ji ama atụ n'ihe dị icheiche ha na-eme.

Na ntụnye nke ya, onye ji ọkwa ‘Knowledge Management and Communication Officer’ n'ụlọọrụ ahụ, bụ Maazị Henry Anagboso gwara ndị ahụ e nyere ọzụzụ ahụ etu ha ga-esi na-achọpụtasị akụkọ ọgbụgbaama ndị ritegoro uru n'atụmatụ IFAD-VCDP nwetegoro, ma gwakwa ha ka ha na-achọpụta ụdị akụkọ ọgbụgbaama dị etu ahụ ma na-akọpụtakwa ya, ọkachasị dịka o siri metụta ọganihu IFAD-VCDP wetegoro nà ụzọ o sigoro kwàlite mmepe obodo.

Ọ gwara ha na ọ bụ ịchọpụta, idepụta na ịkọpụta akụkọ ọgbụgbama dị etu ahụ bụ isi sekpụ ntị n'ọzụzụ ahụ e nyere ha, ma gwa ha ka ha na-ede akụkọ ha n'ụdị dị nkenke ma na-egosipụtakwa etu ọnọdụ dị tupu onye ha na-ede akụkọ ọgbụgbama ya erite uru n'atụmatụ nkwàdo IFAD-VCDP, nà etu ọnọdụ dịzị oge o ritechara uru ahụ.

N'okwu ha n'otu n'otu, ụfọdụ ndị sonyere n'ọzụzụ ahụ, nke gụnyere Humphrey Nzekwu, Ngozi Nwankwor, na Chukwudi Chukwuka kwupụtara obiụtọ ha banyere ohere ọma ahụ nà ihe dị icheiche ha mụtara n'ebe ahụ, ma kwe nkwa itinye nkụzi niile ahụ e nyere ha n'ọrụ ma jirikwa ya rụpụta ihe a tụrụ anya.