Ezinaụlọ Ndị A Tọọrọ n'Ụgbọoloko Kaduna Emeela Ngagharị Ka O Mere Abalị 100

Ezinaụlọ Ndị A Tọọrọ n'Ụgbọoloko Kaduna Emeela Ngagharị Ka O Mere Abalị 100

 Chinwendu Uzoatu
   
O meela otu narị ụbọchị ndị omekome ji wakpo ụgbọoloko si Kaduna aga Abuja ma tọrọ ọtụtụ ndị nọ n'ime ya. Ndị ha tọọrọ atọrọ nọ n'aka ha kemgbe ahụ, o nwebeghị onye hụrụ ha anya. Njem kaara iwe awa abụọ abụrụla nke ha nọrọ otu narị ụbọchị, mana ha alọtabeghị

A tọọrọ ndị njem ahụ ka ọnwa Maachị dị n'abalị iri abụọ na asatọ, n'ahọ a bụ 2022. A tọhapụrụ mmadụ iri na otu na nsonso a ma jidesie mmadụ iri ise ndị ọzọ ike.
 Ọnọdụ ọjọọ ahụ bụnnọọ nke na-ekponyere ezinaụlọ ha aja na garị, ọkachasị ebe ndị ntọrị ahụ jụrụ ikwu ihe ha chọrọ.
 Ezinaụlọ ndị ahụ sị: "Ha na-arahụ n'ezi, n'okpuru anwụ na mmiri, ma bụrụ ndị a hapụrụ n'ihe iche aka mgba dị icheiche na-esite na gburugburu tinyere nsogbu metụtara ahụike."
  Ya mere, n'ihi ọnọdụ a, ezinaụlọ na ndị enyi ndị ahụ e ji eji mere ngagharịiwe n'ụzọ udo ma kpagharịa n'ọtụtụ okporoụzọ a maara nke ọma na Kaduna, wee rịọ ndị ọrụ nchekwa na Onyeisiala Muhammadu Buhari ka ha gbaa mbọ hụ na a tọhapụrụ ndị nke ha e ji eji. N'agbanyeghị na a tọhapụla mmadụ iri na otu, ezinaụlọ ndị ahụ e ji eji kwuru na ọṅụ ha agaghị ezu oke wee ruo na a tọhapụchaa ha niile. Ha kwuru na ha dị njikere ime ihe ọbụla iji hụ na a tọhapụrụ ndị nke ha.

Ha gbakọtara maka ngagharị ahụ ka o ji ọkara gafee elekere asaa nke ụtụtụ na Nagwamatse House dị na Kaduna ma jirichaa obosara akwụkwọ e dere dị icheiche wee kpọọ òkù ka a tọhapụ ndị ahụ ka nọ n'aka ndị ntọ.

 Ka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu mgbe ha mechara ngagharịiwe ahụ, onye ndu otu ahụ, Dọkịnta Abdulfatai Jimoh sịrị: "Taa ka o mere otu narị ụbọchị kpọmkwem a tọọrọ ndị anyị hụrụ n'anya. O kwesiri ịbụ njem awa abụọ, mana ọ ghọọla nke otu narị ụbọchị. Kemgbe ahụ, ọnọdụ anyị ghasara aghasa."
 Ọ gara n'ihu kwuo na ọ na-awụ ha akpataoyi iche ụdị ọnọdụ ndị nke ha nọ n'aka ndị ntọrị ahụ, kemgbe otu narị ụbọchị, n'ime oke ọhịa, yiri otu akwa n'enweghị ezi mmiri ọṅụṅụ na nlekọta ahụike. Ọ rụtụrụ aka na ọtụtụ n'ime ha nọ n'ọrịa, ebe a gbara ọtụtụ n'ime ha egbe.
 
O kwuru na ha dị mbụ arịọ gọọmenti ma na-arịọkwa ugbua ka ha lebaa anya n'okwu ma hụ na a tọhapụrụ ndị e ji eji. O kwuru na ọ bụ ụgwọ gọọmenti ji ndị ọ na-achị, ịhụ na ha na-agagharị n'ezi nchekwa.
 Ọ dị ncheta na ndị ahụ e ji eji gụnyere nwaanyị gbara ahọ iri asatọ na ise. Ha niile bi n'ime ọhịa n'etiti ụmụanụmanụ kemgbe ahụ, tinyere ihe iche aka mgba niile juru n'ime ọhịa.
 Ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ wee kpọọ oku ka e lebaa okwu ahụ anya tupu ihe riri ụtara arachaa ofe.