Enyi Azọgbuola Nwoke Chọrọ Iji Ya Sèé Foto, Merụọ Onye Ọzọ Ahụ

Mar 17, 2023 - 12:50
Mar 17, 2023 - 13:06
 0
Enyi Azọgbuola Nwoke Chọrọ Iji Ya Sèé Foto, Merụọ Onye Ọzọ Ahụ

Izunna Okafor dere akụkọ a


Otú nwoke, bụ Maazị E. Ramkumar, zutere ọnwụ mberede ya na nsonso a oge ọ chọrọ iji otu nnukwu ényí (elephant) wee sèé foto onwe a maara dịka ‘selfie’.

Ya bụ ihe ọdachi bụ nke mere na mpaghara Ndịda mba India ụbọchị Tuzdee, ma bụrụkwa nke wetere ọnwụ nwoke ahụ ozigbo.

Dịka akụkọ siri kọọ, ya bụ nwoke gbárá afọ iri abụọ na asaa hụrụ ìgwè enyi ebe ha na-akpagharịrị onwe ha ebe ha na-akpa nri, wee garuo nso ebe ahụ ka o jiri ha wee sèé foto onwe. Ka ọ na-achọ ime nke ahụ, ihe kòchààrà ya, ọ daa, otu n'ime ìgwè enyi ahụ wee rịgoro ya n'elu, ma jiri ụkwụ zọ̀sịa ya nsị n'afọ, bụkwazị nke wetere ọnwụ ya ozigbo.

A kpọrọ ndị na-ahụ maka anụmanụ na-ebi n'ọhịa ozigbo ya bụ ihe mere, mana tupu ha abịaruo ebe ahụ, nwoke ahụ abụrụla onye nwụrụ anwụ.
Nnyocha e mere na-egosi nwoke ahụ gbàrà afọ iri abụọ na asaa, ma bụrụkwa onye sitere obodo Kattu Kollai dị na mpaghara Krishnagiri nke steeti Tamil Nadu.

N'akụkọ ọzọ dịkwa ka ibe ya, otu nwoke nọ n'ụlọọgwụ ugbua anara ọgwụgwọ, dịka enyi wakpòchàrà ya wee merụsịa ya ahụ oge ọ chọkwàrà iji ya sèé foto onwe. Nke a bụ nke dapụtara n'otu obodo dị na mba Tanzania.

Dịka Onyeisi ndị uweojii na mpaghara obodo ahụ, bụ Maazị George Katabazi siri kọwaa, enyi ahụ sò n'otu n'ime enyi ndị gbapụrụ̀ ebe a na-azụ ha dị na mpaghara Mgbago Ugwu nke Manyara na nsonso a, wee nọrọ n'ubi mmadụ na-akpa nri.

Maazị Katabazi kọwàrà na iwe were elephant ahụ oge ndị obodo ahụ na-abịakutesi ya ma na-enye ya nsogbu ebe ahụ ọ na-akpa nri site n'iji ya ese foto; onye sèchaa pụọ, ọ ga kpọọ nwanne ya; iwe wee wee ya bụ enyi. Nke ahụ mezịrị o jiri wakpò otu nwoke n'ime ndị ahụ ji ya ese foto, wee merụsịa ya ahụ.

Ya bụ nwoke nọ̀zị̀ ugbua n'otu ụlọọgwụ dị na Kiteto anara ọgwụgwọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484