Ekeresimesi: A dọọla ndị mmanwụ aka ná ntị banyere ịkwụchisi okporoụzọ

Dec 25, 2022 - 11:54
 0
Ekeresimesi: A dọọla ndị mmanwụ aka ná ntị banyere ịkwụchisi okporoụzọ

Izunna Okafor dere akụkọ a

Okenye isi awọ anaghị adị mma ikpo aja oròórò, maka na Okeke nwaanyị dị ntị njọ.

N'ihi nke a, gọọmenti steeti Anambra adọọla ndị mmanwụ na ndị na-eti mmanwụ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ ka ha gharakwa ịkwụchisi okporoụzọ maọbụ mee ihe ọbụla ga-ewete agbakata akwụrụ na mpaghara ebe ọbụla, ọkachasị n'ime oge mmemme ekeresimesi a na afọ ọhụrụ a a na-achọ ịgba.

Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi n'ime steeti Anambra, bụ Maazị Paul Nwosu bụ ya kwupụtara nke a site n'ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ ụbọchị Wenezdee n'Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

Dịka o siri kọwaa, gọọmenti steeti ahụ na-agbasi mbọ ike iji hụ na e nwere ije awele n'okporoụzọ dị icheiche na steeti ahụ ma gharakwa inwe oké agbakata akwụrụ ahụ a na-adị enwekarị n'oge mmemme.

Ọ sịkwazị na ọ bụ iji mmezupụ̀ta nke ahụ ka gọọmenti ji akpọkù ndị mmanwụ na ndị na-eti mmanwụ n'ime steeti ahụ ka ha na-eme ya n'obo mmanwụ, n'ama egwuregwu obodo, maọbụ n'ebe ndị ọzọ dị icheiche e wepụtara maka ime nke ahụ.

O kwuru na a chọpụtara na ndị mmanwụ na ndị na-eti mmanwụ so ná ndị na-wetekarị agbakata akwụrụ n'okporoụzọ dị icheiche, ọkachasị n'ime obodo n'oge dị ka oge a, n'ihi na ha ahapụla ịgba egwu n'ụlọ, na-agbazị n'ama.

N'otu aka ahụ, Kọmishọna Nwosu dọ̀kwàzị̀rị̀ ndị na-ere mmanya na anụ aka na ntị banyere etu ọtụtụ n'ime ha si edochikarị oche n'okporoụzọ n'ime oge a ma jirizie ya mere ebe ha na-ere ahịa na ebe ha na-eme ihe mmemme na ihe ngosi obiụtọ dị icheiche, ma sikwa n'ụzọ dị otú ahụ na-ewete agbakata akwụrụ n'okporoụzọ. 

Ọ gwara ndị na-eme ihe dị otu ahụ ka ha sepu aka na ya, n'ihi na ọ bụghị naanị na ọ na-ewete agbakata akwụrụ n'okporoụzọ, kama na o jupụtàkwàrà n'ọtụtụ ihe égwù dị icheiche, ọkachasị ihe égwù nke mberede okporoụzọ.

Maazị Nwosu dọ̀kwàzị̀rị̀ aka ná ntị na onye maọbụ mmanwụ ọbụla a ga-ejide ka ọ na-ada iwu a maọbụ na-ewetere ndị mmadụ oké agbakata akwụrụ n'okporoụzọ n'ime oge a na mpaghara ebe ọbụla na steeti Anambra ga-abụ onye a ga-anwụchikọ ma kpụpụ ya ụlọikpe.

O nyèrè ndị eze ọdịnala na ndị ndú obodo dị icheiche na steeti ahụ ntụziaka ka ha buru ozi ahụ wee bàá n'ime obodo ha dị icheiche ma mee ka ndị obodo ha mara maka ya.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484