EFCC Anwụchiela Mmadụ 74 Maka Yahoo Yahoo na Port Harcourt

EFCC Anwụchiela Mmadụ 74 Maka Yahoo Yahoo na Port Harcourt

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịmazụ ego ọhaneze na igwu ojoro, bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ ejidela mmadụ iri asaa na anọ (74) a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro na ndị na-ezu ohi site n'usoro nzikọrịtaozi ọgbaraọhụrụ, bụ ndị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’ na steeti Rivers.

Dịka ozi si n'aka ngalaba mgbasaozi nke ụlọọrụ EFCC siri kọwaa, mmadụ iri asaa na anọ ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ na mpaghara Port Harcourt bụ isi obodo steeti ahụ n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa a, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ n'ọnụ ụtụtụ oge e nwetechara ozi bayere ha na arụrụala ha.

Ya bụ ozi gara n'ihu kọwaa na n'ime mmadụ iri asaa na anọ ahụ, na mmadụ iri anọ na asatọ n'ime ha bụ ndị e nwetere ụfọdụ ihe dị icheiche n'aka ha, bụ nke na-egosi na ha dị ka ebubo ahụ e boro ha.

Ihe dị icheiche e nwetere n'aka ndị ahụ gụnyere: ọmarịcha ụgbọala ise dị oke ọnụ ahịa, ụdị ekwentị dị icheiche, ụdị igwe omechancha laptọp dị icheiche, ATM, tinyere ihe ndị ọzọ.

Dịka ozi ahụ siri kọwaa, aha  ndị ahụ e jidere gụnyere: Promise Sunday, Ukala Goldman, Isaac Golden, Peter Ikechukwu, Bankole Olamide, John Chiemela, Thomas Martins, Dr Victor, Emmanuel Owuma, Emmanuel Sekun, Philip Abaku, Emmanuel Egwuanumku, Thompson Charles Lekia, Ken Anelele Marvel, Kelechi Prince, Ugochukwu Ukaigwe, Ake John, Victor Madu, Moses Jubril Akrah, Jonathan Jeffery, Noble Lot, Success Umukoro, Precious Michael na Christabel Enoch.

Ndị ọzọ gụnyere: Desmond Ogu, Louis Abbas, Donaldson Ugbo, Kelvin Dickson, Henry Messiah, Godwin Egwelike, Timinepre Esuku, Mathew Kelvin, Alfred Friday, Nyderson Mufisa Nwogu, Boyle Edward, Ifeanyi Elum, Richard Welle Chikodi, Ogu Raymond, Tamunoturoko Briggs, Kenedy Patrick, Shadrach Savior, King Nwonuma, Chisom Umah, Joseph Effiong, Kelvin Ifeanyi, Birabil Lessi Junior Goodness, George Nnamdi na Doro Precious.