E Nyela Ndi Ọrụ Injinia Ọzụzụ n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a
Akpọkuola ndị ọrụ injinia n'ime steeti Anambra ka ha gaa n'ihu na-amụtasịkwa ihe dị icheiche ga na-enyere ha aka n'ọrụ ha, ọkachasị dịka o siri metụta ịrụ ya n'usoro ọgbraọhụrụ.
Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti Anambra, bụ Maazi Ifeanyi Okoma bụ ya kwuru nke a n'ọgbakọ ọzụzụ a chịkọ̀baara ndị ọrụ Injinia nọ n'okpuru ụlọọrụ ya n'Awka na nsonso a.
Ọ gwara ha mụta etu e sịgasị eme ihe ụfọdụ ha amaghị eme, dịka ọ siri metụta ọrụ ha na etu e si arụ ya n'usoro ọgbaraọhụrụ na n'usoro kacha mma, n'ihi na nke ahụ ga-enye aka kwalite ogoogo ha na arụmọrụ dịka ndị ọrụ Injinia, ma nyekwa aka belatara gọọmenti ego ọ na-emefù n'ịrụ ụfọdụ ọrụ dị icheiche na steeti ahụ, n'ihi na a gaghị agazị n'iro ịchọ mmadụ oge ọbụla a chọrọ onye ma arụ ụdị ọrụ ahụ.
O chètààrà ha ezi atụmatụ ọrụ na ebumnobi dị icheiche aka na-achị steeti ahụ ugbua bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo jiri bata n'ọkwa maka ọdịmma ụmụafọ Anambra na ọnọdụ mmepe steeti ahụ; ma mee ka ha mara na ha sòkwà n'isi sekpụ́ ntị na ndị a ga-eji mezupụta nke ahụ.
Ọ dụ̀kwara ha ọdụ ka ha ghara iche na ha amarachaala maọbụ mụ̀tachaa, maka na ọ na-abụ chi na-efo, ihe ọhụrụ ana-apụ̀ta; tinyekwuoro na a naghị amacha ihe amacha, maka na ụwa nà-eme ntụgharị; nke mezịrị o jiri dị mkpa na onye ọbụla ga na-agbàkwụnye n'ihe ọ mụtagoro na mgbe na mgbe.
Kọmishọna Okoma gwara ha tinye ihe dị icheiche ha mụtara n'ọzụzụ ahụ n'ọrụ, iji nyere ha aka n'ịrụ́ ọrụ ha nke ọma.
What's Your Reaction?






