E Nyela Ndị Ntorobịa Ruru Narị Ise Ọzụzụ na Ego Nkwàdó n'Anambra

E Nyela Ndị Ntorobịa Ruru Narị Ise Ọzụzụ na Ego Nkwàdó n'Anambra


Izunna Okafor dere akụkọ a

Ndị ntorobịa ruru narị ise nọrọ na nsonso a wee nweta ọzụzụ maka ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha na steeti Anambra.

Ya bụ mmemme inye ọzụzụ bụ nke a chịkọbara n'okpuru atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ site n'aka ngalaba ‘Anambra state Cash Transfer Unit’ nke steeti Anambra, ma bụrụkwa nke e mere site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka ọnọdụ akụnụba na amụma ego ọrụ (Ministry of Economic Planning and Budget) na ụlọọrụ na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze n'Anambra (Ministry of Women and Social Welfare).

Ọzụzụ ahụ were mkpụrụ ụbọchị anọ bụ nke a chịkọtara n'obodo Isuanịọcha dị n'okpuruọchịchị ime obodo Awka North.

Atụmatụ ‘Anambra COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (AN-CARES)’ bụ otu n'ime atụmatụ nkwàdo dị n'okpuru atụmatụ ‘Nigeria COVID-19 Action Recovery and Economic Stimulus (N-CARES)’, bụkwa nke na-enweta nkwàdo site n'aka ụlọ ọba ego mba ụwa (World Bank), ma bụrụkwa nke a na-ekesà nkwàdo ya n'ime steeti dị icheiche dị n'ala Nigeria site n'ak ngalaba ụlọọrụ ‘Cash Transfer Office’ nke steeti ọbụla.

Ọ bụkwa nke a na-esite na ya nye ndị ntorobịa ọzụzụ ịbụ ndị kwụụrụ onwe ha, ma nyekwa onye ọbụla n'ime ha ego nkwàdó dị narị puku naịra abụọ iji malite ihe ọ mụtàrà n'ọzụzụ ahụ.

N'okwu ya na mmemme inye ọzụzụ ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara ụmụnwaanyị na ọdịmma ọhaneze na steeti Anambra, bụ Oriakụ Ify Obinabo dụrụ ha ọdụ ka ha jiri ohere ọma nke ọzụzụ ahụ nà nkwàdo ahụ e nyere ha wee guzoro ma bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha

O kelekwara ndị na ụlọọrụ dị icheiche soro nye aka n'ịhazi ọzụzụ ahụ, maka ezi ọrụ ha, ma gbakwa akaebe na ntorobịa ahụ bụnnọọ ndị e hiri asaa n'anya wee họpụta maka isonye na ya bụ ọzụzụ.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ngalaba ‘Cash Transfer Unit’ na steeti Anambra, bụ Maazị Ralph Enukorah kelere ọchịchị steeti ahụ maka nkwàdo dị icheiche o nyere ha, ịke mere ka ya bụ ọzụzụ gaa siriri-werere, ọbụladị dịka ọ gwara ndị ahụ sonyere na ọzụzụ ahụ na onye ọbụla n'ime ha ga-enweta ego ya site n'akara ọba ego ha dị icheiche, ma dụkwazie ha ọdụ ka ha jiri ego ahụ mepụta ihe a tụrụ anya na ihe e mebeere ya.

Ndị ntorobịa ahụ sonyere n'ọzụzụ ahụ kwupụtara obiụtọ ha maka nke ahụ, ma kelee ndị chịkọbara ya bụ ọzụzụ ma nyekwa ha ego nkwàdo dị n'elu ya. Ha kwezịkwara nkwà na ha ga-eji ego ahụ na ihe dị icheiche ha mụtara n'ọzụzụ ahụ wee baara onwe ha uru ma bụrụkwa ndị kwụụrụ onwe ha.

Ndị ntorobịa narị ise ahụ bụkwa ndị a họtara site n'okpuru ọchịchị dị icheiche dị na steeti ahụ maka isonye na ya bụ mmemme.