E Jidela Onye Nta Akụkọ Dara Iwu Okporoụzọ na Lagos, Daa Ya Nha

E Jidela Onye Nta Akụkọ Dara Iwu Okporoụzọ na Lagos, Daa Ya Nha

Nkechi Ikenwoke


Onye nta akụkọ Rufai Oseni adaala iwu okporoụzọ na Lagos oge ọ na-eme njem. 

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Benjamin Hundeyin na odeakwụkwọ mgbasaozi nyégárá aka na-achị steeti ahụ, bụ Gboyega Akosile bụ ha kwupụtara nke a.

N'okwu ya banyere nke ahụ, Oseni kọwara na a tụdoro ya egbe ma buru ụgbọala ya.

Ọ sị, “Onye uweojii ala Nigeria tụdoro m egbe, nara m igodo ụgbọala m ma buru ya gbapụ ọsọ.”

Oge ọ na-akọwa ka ya bụ ihe siri mee, Hundeyin kọwara na Rufai dàrà iwu ịgafe nkeji ụzọ BRT ma kwuo na a ga-ata onye uweojii ahụ ahụhụ maka ịtụdo ya egbe.

Ọ sịrị, "Maazị Rufai Oseni bịara ụlọ ikpe taa. A mara ya ikpe ịda iwu okporoụzọ Steeti Lagos nke ahọ 2018. Ọ kwụrụ naanị puku naịra iri asaa tupu e bunye ya ụgbọala ya.”