E Jidela Onye Nche Zuru Ego Onyinye n'Ụlọụka

Oct 9, 2022 - 05:00
 0
E Jidela Onye Nche Zuru Ego Onyinye n'Ụlọụka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ụkwụ na-aga warawara, anya na-aga warawara na-ahụ ya.

O wee bụrụ otu ahụ ka ndị uweojii n'ime steeti Ekiti siri nwụchikọọ otu nwoke gbara afọ iri ato na atọ maka izu ego e jiri onyinye n'otu ụlọụka ma buru ya larie.

Nwoke ahụ, bụ Maazị Akindele Olufemi, ka e kwuru na o zuru ego ruru narị puku naịra isii na iri abụọ na uma otu narị naịra na iri na ise (N620,115) n'otu ụlọụka a maara dịka ‘Christ Apostolic Church’s Campground’ dị na mpaghara Ikeji Arakeji nke steeti Osun ma bụrụzie ya na-ala na steeti Ekiti, tupu aka ndị uweojii wee kpàrá ya na mpaghara Igbara Odo Ekiti.

Dịka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n'ime steeti Ekiti bụ DSP Sunday Abutu Siri kọwaa, ọ bụ oge ndị uweojii nọ n'ogologo ụzọ awara-awara Igbara-Odo-Akure na-akwụsị ma na-enyocha ụgbọala na ndị nọ n'ime ya ka ha hụrụ Olufemi ka o kò àkpà ụmụakwụkwọ n'azụ, nke mezịrị ka ha kpọ̀ghee ya iji mara ihe dị n'ime ya.

Kaosiladị, ọ sị na mgbe ndị uweojii kpọ̀ghere akpa ahụ, na ha hụrụ ụdị ego dị icheiche n'ime ya, wee gbabazie nwoke ahụ ajụjụọnụ otu ya na ije siri gaa.

DSP Abutu gara n'ihu kwuo na ya bụ nwoke gwara ha nke bụ eziokwu, nà ọ bụ ego onyinye o zuru n'ụlọụka dị ihe ahụ juru n'akpà ya, ma kwuo na ọ bụkwa n'ụlọụka dị n'Osun ka o siri zute ya. 

Dịka o siri kwuo, nwoke ahụ kọwàrà na ya bụ onye ọrụ nchekwa na-arụ n'ụlọụka ahụ n'oge mbụ, mana o mèchààrà were aka ya gbaa ‘arụkwaghịm’ (resigned), wee nọgide otu ụbọchị sị ka ọ gaa n'ụlọụka ahụ mara na ọ ga-ezúchata obere ego, maka na agụụ karịzị̀rị̀ n'obodo. Ọ sị na nwoke ahụ kwukwàrà na ọ bụ ego niile e nyòtèrè n'onyinye ụlọụka ahụ ụbọchị ahụ ka o kpokọọrọ.

DSP Abutu gara n'ihu kwuo na a ga-akpụpụ̀ nwoke ahụ ụlọikpe ngwangwa e mèchàrà nnyocha banyere arụrụala ahụ, ebe a ga-ejikwa usoro iwu wee nyụchaa ya anya.

 

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484