E jidela nwaanyị dị ime ọnwa iteghete maka ọgwụike

Dec 8, 2022 - 09:08
Dec 8, 2022 - 09:10
 0
E jidela nwaanyị dị ime ọnwa iteghete maka ọgwụike

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onye a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ.

Ka ọ dị taa, ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide ịñụ, ịkpọ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n'ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ ejidela ụfọdụ ndị a na-enyo enyo na ha na-etinye aka n'ịtụ mgbere ọgwụike.

Dịka ozi a kụpụrụ na nsonso a n'Abuja site n'aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n'isi ụlọọrụ NDLEA, bụ Maazị Femi Babafemi siri kọwaa, ndị ahụ e jidere gụnyèrè otu nwaanyị dị ime, bụ Oriakụ Kate Ibinabo (gbara afọ iri abụọ na iteghete), otu nne nwaanyị, Oriakụ Ibinosun Sandra Esther (gbara afọ iri isii), tinyéré ụfọdụ ndị ọzọ.

O kwuru na ụlọọrụ ahụ bagidèrè ọrụ pụrụ iche na mpaghara steeti ise nà isi obodo ala Nigeria bụ Abuja, ma nwetekwa ọtụtụ ọgwụike dị icheiche n'aka ha, nke gụnyere: ọgwụike mkpụrụ mmiri (methamphetamine); ọgwụike kanabis sativa (cannabis sativa) ike arọ ya ruru 5,527.15; mkpụrụ ọgwụike tramadọl ruru 132,090 n'ọnụọgụgụ; na karama ọgwụike kodin (codeine) ruru 2000 n'ọnụọgụgụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.

Dịka o siri kọwaa, ya bụ nwaanyị, Oriakụ Esther bụ onye e jidere n'Ibadan dị na steeti Oyo ka ọ gachara obere oge e jiri hụchaa ma nwụchikọọ ọgwụike kanabis e siri mba South Africa bubàta Nigeria. Ọ kọwàrà na nwaanyị ahụ kwùrù na ọ bụ nwa ya nwaanyị nọ mba ofesi zìlalàtaara ya ihe ahụ, bụkwa nke e tinyere n'ime ihe e ji akpọ egwu wee zilata ya; e wee nwụchikọọ ya n'ọdụ Ụgbọelu Mba Ụwa Murtala dị n'Ikeja, Lagos.

Banyere nwaanyị nke dị ime, bụ Oriakụ Ibinabo; Maazị Babafemi kwùrù na ọ bụ ndị ọrụ NDLEA nọ na steeti Rivers nwụchikọrọ ya na mpaghara ebe a na-akpọ Ọkịrịka na steeti ahụ, ma bụrụkwa onye e nwetere ọgwụike kanabis ruru 34.4kg n'aka ya.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ebe ndị ọzọ ndị ọrụ ha jidesiri ndị mmadụ na ọgwụike gụnyèrè steeti Ondo, Steeti Cross River na Steeti Yobe.

N'okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ NDLEA n'ala Nigeria, bụ Maazị Mohammed Buba Marwa kwupụtara obiụtọ ya banyere ezi ọrụ ahụ ndị ọrụ ya rụrụ site n'ịnwụchikọ ndị ahụ, kelee ha, ma gbàkwazie ha ume ka ha jisie ike n'ọrụ. O kwezịrị nkwa na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe, ebe a ga-eji usoro iwu wee gwọọ ha ji mmanụ, dịka ihe ha metara siri dị. 

Dịka ọ na-ekwe nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma kpee ha ikpe banyere ihe ha mere, ọ dụkwara ndị na-etinye aka n'ọgwụike ka ha sepu aka na nke ahụ, n'ihi na ụlọọrụ ahụ na ndị ọrụ ya agaghị ada mbà n'ibu agha megide ihe ọbụla bụ ọgwụike n'ala Nigeria.

Kaosiladị, o nyere ntụziaka ka a tọhapụ nwaanyị ahụ dị ime ka ọ ga mụchaa nwa we bịaghachi, ebe ọ bụ na afọ ime ya nọ n'ọnwa nke iteghete, maka ya ịmụ nwa ebe ọ nọ na nga.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484