E Guzobela Otu Jikọtara Ndị Wikimedia n'Anambra

E Guzobela Otu Jikọtara Ndị Wikimedia n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ bụ nnukwu ọgbakọ ndị ụbụrụ ha na-aghọ nkọ na ndị nwere mmasị pụrụ iche, dịka e guzobere otu jikọtara ndị na-edezi edemede maọbụ na-etinye edemede ọhụrụ, foto maọbụ ihe ndị ọzọ na Wikipedia n'ime steeti Anambra.

Ya bụ mmemme bụ nke weere ọnọdụ n'isi ụlọọrụ ‘Nigerian Book Foundation’ dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị mmadụ, nke gụnyere ndị na-arụ n'ọbá akwụkwọ, ndị na-edemede, na ọtụtụ ndị ọzọ.

Òtù ọhụrụ ahụ bụ nke a kpọrọ ‘Anambra Network of Wikimedia Usergroup’ nke ‘Wikimedia Usergroup Nigeria’ ma bụrụ nke a họpụtara Dọkịta Ngozi Perpetual Osuchukwu dịka onyeisi ya na steeti Anambra. A họpụtàkwàrà Dọkịta Nkem Osuigwe dịka onye ndụmọdụ nke òtù ahụ, họpụta Adaora Obuezie na Timothy Chibuike Ezenwanne dịka Osote Onyeisi. 

N'okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi òtù Wikimedia Usergroup Nigeria, Maazị Olushola Olaniyan nyèrè nkọwa banyere ihe òtù ahụ pụtara na ihe ha na-eme, ma kọwaa ihe mere o jiri dị mkpa na ha guzobere ngalaba òtù ahụ na Steeti Anambra, iji hụ na ha na-enye aka na-etinyesi ihe dị icheiche gbasaara steeti ahụ na Wikipedia, bụ ebe ọtụtụ mmadụ na-aga maka inwete ozi dị icheiche.

Ọ kọwàrà na nguzobe ahụ ha guzobere otu ahụ n'Anambra ga-enye aka ịkwàlite mgbasa ozi banyere Wikimedia na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria, ọbụladị dịka ọ dụrụ ndị òtù ahụ ka ha nye aka n'ịchịkwa na ịkwàlite ọganihu nke òtù ahụ n'ime steeti ahụ 

N'okwu ha n'otu n'otu, onye ji ọkwa dịka ‘Community Lead, Wikimedia Usergroup Nigeria’, bụ Maazị Kayode Yussuf, na onye ji ọkwa dịka ‘Project Director, Wikimedia Usergroup Nigeria’, bụ Maazị Ayokanmi Oyeyemi kọwààrà ndị òtù ahụ ihe dị icheiche a na-atụ anya n'aka ha, gwa ha ka ha nà ndị òtù ha na-esonyesi ike n'ihe ọbụla otu Wikimedia na-eme; ma kwe nkwà inye ha nkwàdó kwesiri ekwesi iji mee nke ọma n'ọrụ ha.

N'okwu ya n'aha ndị òtù ya, onyeisi òtù ahụ e guzobere ọhụrụ, bụ Dọkịta Ngọzi Osuchukwu kèlèrè ndị òtù ahụ maka ịhụta ya dịka onye tozuru okè ịnọ̀ n'isi òtù ahụ na steeti ahụ, ọbụna dịka o kelèkwàra ha maka isonye na mmemme ahụ, nke e jiri ọgbakọ̀ nkuzi were abalị abụọ wee malite.

O kwùrù na ọkwa ahụ bụ ọkwa dị elu, ma bụrụkwa nke ọrụ dị elu dị na ya. Ọ kpọkukwàzị̀rị̀ ndị òtù ahụ n'ime steeti Anambra ka ha gaa nye ya nkwàdó zuru okè iji duo ha nke ọma, ya na iji hụ na ngalaba òtù Wikimedia n'ime steeti Anambra ga-abụ nke e ji ama atụ.

Na mbụ n'okwu ya, Onye Ndụmọdụ òtù ahụ n'ime steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkem Osuigwe, onye nwetere nturuùgò dịka ‘Wikimedian of the Year 2022’ n'ụwa gbaa gburugburu, kwukwàrà na mmadụ karịrị otu ijeri na ụma n'ụwa gbaa gburugburu na-aga na Wikipedia kwà ọnwa ọbụla. O kwukwàrà na nguzobe ahụ e guzobere otu ahụ n'ime steeti Anambra ga-enye aka ime ka ọtụtụ ndị ga na-eje na Wikipedia ahụ, ndị na-etinye ozi ebe ahụ na ozi e tinyere ebe ahụ bụrụ ndị si Anambra. 

Ụfọdụ ndị dị icheiche sonyere nà mmemme ahụ, nke gụnyèrè onyeisi ọba akwụkwọ steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze; Ọ̀kammụ̀ta Mercy Anyaegbu; Dọkịta Hope Chikaodiri; na ‘Lady’ V. Ezejiofor tòrò ndị ahụ e guzobere ọhụrụ dịka ndị ndú òtù ọhụrụ ahụ, ma nyekwazie ndụmọdụ n'usoro dị icheiche e nwere ike isi kwàlité otu ihe si aga na Wikipedia, ọkachasị dịka o siri metụta itinye ozi ebe ahụ.

Onyeisi òtù ọhụrụ ahụ n'Anambra, Dọkịta Osuchukwu bụ onye ọrụ oba akwukwo nwetegoro nzere agụmakwụkwọ dị icheiche na ngalaba ihe ọmụmụ gbasara Ọba Akwụkwọ, ma bụrụkwa onye nkụzi mahadum, na onye na-enwe mmasị pụrụ iche n'ịkụziri ndị mmadụ ihe dị icheiche ha kwesiri ịma.