Bishọp Ezeokafor Eriela Ji Ọhụụ n'Awka

Bishọp Ezeokafor Eriela Ji Ọhụụ n'Awka

Izunna Okafor dere akụkọ a

Onyeisi nchụaja ụka Katọlik na dayọsis Awka, bụ Bishọp Paulinus Ezeokafor nọrọ ụbọchị Tuzdee wee merùbé mmemme iri ji ọhụụ ya nke ahọ 2022.

Ya bụ mmemme dara ụda bụ nke e mere n'ụlọuka St. Patrick's Cathedral dị n'Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọrụ ụka sitere ebe dị icheiche n'ime dayọsis ahụ wee bịa.

N'okwu ya oge o kpechara ekpere, gọzie, waa ma surukwa ji ọhụụ nke ya, rie na mmemme ahụ; Bishọp Ezeokafor kọwàrà ji dịka eze nke ihe a kọ̀rọ̀ n'ugbo, ma kelekwazie Chineke maka ndụ, ngọzi, nchekwa na ahụike o nyere ha, ha wee merùbé mmemme iri ji ọhụrụ nke ahọ a. O kelèkwàra Chineke maka otu o siri gọzie ala na ihe omume ya ma gọzikwa ndị ọrụ ugbo, ha wee kọ̀ọ́ ma gwute n'ùjú.

Ya bụ onyeisi nchụaja, Bishọp Ezeokafor, gàkwàrà n'ihu kọwaa mmemme iri ji ọhụrụ dịka nnukwu mmemme na omenala pụrụ iche e ji mara ndị Igbo; ma kọwakwa ya dịka oge inye Chineke ekele.

O kọwàkwazịrị na o nweghị ihe ọbụla dị njọ ọ hụtara ná mmadụ imerubè omenala ya, dịka mmemme iri ji ọhụrụ, belụsọ ma e mebezịrị ya n'ụdị nke ikpere arụsị maọbụ n'ụdị adabaghị adaba n'okwukwe ezi onye otu Kristi.

Ọ kpọkuru ndị Igbo ka ha jigidesie omenala ha ike, na-echekwaba ma na-emesikwa ya ike otu kwesiri ekwesi, ka o wee ghara ifunahị ha. Ọ dụkwàrà gọọmenti, ndị nọ n'ọkwa ọchịchị dị icheiche, na ndị ọzọ e ji okwu ha agba izu n'ala Igbo ọdụ, ka ha na-akwàdó ma na-akwàlite ịma mma nke ọnatarachi na omenala ndị Igbo n'ogoogo dị elu.

Mmemme ahụ dọtàkwàrà onye ji ọkwa ‘Cathedral Administrator’ nke dayọsis ahụ, bụ Rev. Fr. Patrick Okafor; onye ji ọkwa ‘Chancellor’ nke dayọsis ahụ, bụ Rev Fr Charles Ndubuisi, tinyéré ọtụtụ ndị ọrụ ụka ndị ọzọ.