Bishọp Ekwe Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ n'Ụmụeri

Bishọp Ekwe Echiela Ndị Ụkọchukwu Ọhụrụ n'Ụmụeri

Izunna Okafor dere akụkọ a


Bishọp ụka Angịlịkan na Dayọsis Niger West, bụ Bishọp Johnson Ekwe adụọla ndị ụka na ndị ọrụ ụka ọdụ ka ha na-ekwesiri Chineke ntụkwasịaobi oge niile.

Bishọp Ekwe nyere ndụmọdụ a n'okwu ya na mmemme ichi ụfọdụ ndị ụkọchukwu ọhụrụ na dayọsis ahụ na ibuli ha ụfọdụ ndị ọzọ n'ọkwa, bụ nke weere ọnọdụ n'ụlọụka ‘Cathedral Church of St. Gabriel, Umueri' dị n'okpuruọchịchị ime obodo Anambra East na nsonso a, ma bụrụkwa ebe ọ nọrọ wee chie mmadụ iri na otu Dikin na ụkọchukwu, chikwa mmadụ asaa Kanọn.

N'okwu ya oge ọ na-echi ndị ahụ echichi ọhụrụ ahụ, Bishọọpụ Ekwe dụrụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị na-edebe nkwà ha kwere ma na-emezuputakwa iyi ha ṅụrụ, ọkachasị mgbe a na-edu ha n'iyi ọrụ maka ọkpụkpọoku ijere Chineke ozi dịka ndị nchụaja. 

Ọ gwàkwàrà ha ka ha na-agụ ma na-atụgharị uche n'Akwụkwọ Nsọ oge niile, iji wee gbanyesie mgbọrọgwụ ike n'okwukwe ha.

Dịka ọ na-adụ ha ọdụ ka ha bụrụ ndị na-eje ozi ha n'ikwesi ntụkwasịobi, o kpekwazịrị ka Chineke gaa n'ihu ịgbà ha ume na inye ha amara Ya n'ụba iji jeere Ya ozi ma gbasàkwa oziọma alaeze Ya, ọkachasị ugbua e buligoro ha n'ọkwa dị elu, n'agbànyeghị ọnwụnwa maọbụ ihe ịma aka ndị ọzọ ha nwèrè ike izute n'ije ozi ha.

Na mbụ n'okwuchukwu ya na mmemme ahụ, Ven. Ebelechukwu Egbuji dụ̀rụ̀ ndị ka ha na-agbaso usoro okpukpe ụka Angịlịkan na ụkpụrụ ya n'ije ozi ha; ọbụladị dịka o nyekwara ha ndụmọdụ ka ha gbado anya ma na-elekọtakwa ìgwè atụrụ a hanyèrè ha n'aka nke ọma, iji gbochie ha ịda mba n'ime mmụọ maọbụ ịdapụ n'okwukwe.

Ven. Egbuji dụkwàrà ndị ahụ ọdụ ka ha were ịhụnanya wee jeere Chineke ozi, ma gbakwa mbọ bụrụkwa ndị Chineke ga-agbara ama ezi ọrụ ha rụrụ dịka ndị ozi Ya n'ụbọchị ngụkọ, maka na mmadụ ọbụla n'ime ha gà-azarịrị ajụjụ banyere etu o siri gaa ozi ya na etu o siri chịkwaa ìgwè atụrụ Chineke hanyere n'aka ya.

Ọ gwakwara ha ka ha na-ebi ndụ ezi omume ma ghara ibi ndụ aghụghọ, maka na ọ bụ naanị site n'ibi ndụ ezi omume ka ha ga-esi wee keta òkè n'alaeze Chineke.

Ụfọdụ n'ime ndị ahụ e chiri echichi ọhụrụ ụbọchị ahụ, nke gụnyere Chiagozie Nzomiwu, Chinedu Anyaenyi, Marcel Chukwuemeka, Chinedum Ajumobi, Caleb Nntadom, Charles Nwuneli na ụfọdụ ndị ọzọ kèlèrè Chineke maka mbulinọkwa ahụ, kelekwa Bishọp Ekwe maka ịhụta ha dịka ndị tozùrù oke, ọbụladị dịka ha rịọkwara amara, nchekwa na enyemaka Chineke, na nkwàdó na ekpere ụmụ mmadụ, iji nyere ha aka ịga ozi ha nke ọma na n'ikwesi ntụkwasịobi, bụkwa nke ha kwere nkwa na ha ga-eme site n'inyeaka Chineke.

Idu ndị ahụ n'iyi ọrụ, inye ha akwụkwọnsọ, ịtụ mmamma, ịbụ abụ otuto dị icheiche na ịtụ mmamma so n'ihe pụtakarịchara ìhè na mmemme ahụ, tinyere ụfọdụ ihe ndị ọzọ.