Anyị Ga-aga n'Ihu Ịrụrụ ndị Anambra Ezi Okporoụzọ —Soludo

Anyị Ga-aga n'Ihu Ịrụrụ ndị Anambra Ezi Okporoụzọ —Soludo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwela nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịrụ ezi okporoụzọ na steeti ahụ, iwete ezi ọnọdụ mmepe, na ịrụnyesi ihe dị icheiche ga-enye aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

Gọvanọ Soludo kwuru nke a n'okwu ya oge ọ gara njem nleta ịhụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ụfọdụ okporoụzọ dịgasị n'ime ime obodo, bụkwa ebe ọ nọrọ wee gbapee ọrụ n'ụfọdụ okporoụzọ ahụ.

Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n'aka odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Maazị Christian Aburime siri kọwaa, ebe dị icheiche Gọvanọ Soludo gàrà njem ahụ gụnyèrè Okpuno dị n'okpuruọchịchị Awka South, Isuaniocha dị n'okpuruọchịchị Awka North, na Nnewi dị n'okpuruọchịchị Nnewi North.

N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo kọwàrà na ebumnobi o jiri bịa njem nleta ahụ bụ ka o jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri dị ebe ahụ, mara ka ha bụ okporoụzọ siri mebidobe, na otu a ga-esi wee rụgharịa ha. O mèrè ka a mara na obi anaghị atọ gọọmenti ụtọ banyere ihe nhịahụ na ntaramahụhụ mmadụ na-agabiga n'okporoụzọ ụfọdụ dị na steeti ahụ, bụkwazị nke mere ọchịchị ya jiri gbapee ụfọdụ ọrụ okporoụzọ na mpaghara ebe dị icheiche nà nsonso a.

Ya bụ Gọvanọ gàkwàrà n'ihu kwuo na njem nleta ahụ dabakwara adaba na mmezupụ̀ta ụfọdụ nkwa o kwere oge ọ na-achụ nta nkwàdó ọchịchị, dịka o siri metụta ime Anambra ka ọ chawapụ.

Ka ọ na-enye nkọwa banyere ụzọ ndị ahụ, Gọvanọ Soludo kwukwàrà na a ga-arụcha ha n'oge a kàrà àkà, ma rụkwa ha n'ogoogo kwesiri ekwesi, nke na ha ga-anọkarị ahọ iri abụọ tupu e kwube okwu ịrụ ha ọzọ.

Ụfọdụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu n'ọchịchị steeti Anambra sonyèkwààrà Gọvanọ Soludo na njem ahụ, nke gụnyere Osote Gọvanọ, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; Odeakwụkwọ Izugbe Steeti ahụ, bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu; Onyeisi Ndị Ọrụ Gọvanọ, Maazị Ernest Ezeajughi; Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ, bụ Injinia Ifeanyi Okoma; onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ n'ihe gbasara ime mmadụ obiụtọ, mmesapụ ahụ, na njem nlegharịanya, bụ Maazị Bob-Manuel Udokwu, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.