Anyị Aruchaala Àkwàmmiri Naịja Nke Abụọ —Fashola

Anyị Aruchaala Àkwàmmiri Naịja Nke Abụọ —Fashola

 Izunna Okafor dere akụkọ a

Gọọmenti ala Nigeria ekwuola na ya  akpachaala nkị̀tà na-echezị mkpụrụ akwụ n'ihe gbasara ọrụ Àkwà Mmiri Naija nke Abụọ (2nd Niger Bridge) ọ na-arụ n'Ohimiri Naịja dị n'Onitsha, n'ime steeti Anambra.
 
Minista na-ahụ maka ọrụ nà ewumewu ụlọ n'ala Nigeria, bụ Maazị Babatunde Fashola bụ ya kwupụtara nke a ụbọchị Wenezdee n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'Abuja, bụkwazị nke ọ nọrọ na ya kọwaa na a ga-abape ya ka ụgbọala bido ịgba mgbe adịghị anya.

Dịka o siri kọwaa, naanị ihe ji ịgbape àkwàmmiri ahụ ugbua bụ okporoụzọ e si aga na ya, bụ nke a ka kwụsịgodiri ọrụ na ya n'ihi nsogbu iju mmiri na-enye na mpaghara ebe ahụ.

O kwukwàrà na ndị mmadụ nwèrè ike iji ụkwụ wee gafee n'àkwà mmiri ahụ ugbua n'enweghị nsogbu ọbụla, ma kọwaa nà naanị ihe ji ịgbape ya bụ akwammiri ugbua bụ okporoụzọ ahụ ogologo ya dị kilomita anọ, nke jikọrọ akwammiri ahụ na mpaghara Asaba.

Ka ọ na-etò ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari maka ọrụ ọma dị icheiche rụgoro na mpaghara ebe dị icheiche n'ala Nigeria, Maazị Fashola mèkwàrà ka a mara na a ga-agbape ya bụ akwammiri maka ụgbọala ozigbo a rụ̀chara okporoụzọ ahụ, maka na ọ na-abụ a nyụchaa nsị, a kàpị̀ghị̀ ya ọnụ, ọ bụrụ òtòrò.