ANSPPB Akụtuola Ihe A Rugasịrị Ebe Iwu Akwadòghị n'Anambra

ANSPPB Akụtuola Ihe A Rugasịrị Ebe Iwu Akwadòghị n'Anambra

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọ na-abụ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n'ofete nke ọzọ.

O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ 'Anambra State Physical Planning Board' (ANSPPB) siri wee kụtuo ụlọ a rụrụ n'ebe iwu akwdòghị na mpaghara ebe dị icheiche n'ime steeti ahụ na nsonso a, nke gụnyere akụkụ ebe ahụ e wepụtara maka ịrụ ọdụ ụgbọelu ochie n'Oba, na Isu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Idemili South, ya na mpaghara Marine na Woliwo dị n'Onitsha.

N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ banyere nke ahụ, Onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’, bụ Maazị Chike Maduekwe kwùrù na a dọrọ ndị nwe ihe ahụ aka na ntị ọtụtụ oge banyere nke ahụ, mana ha anụghị.

O mekwara ka a mara na ọtụtụ n'ime ala ebe ahụ a rụrụ ihe ndị ahụ bụgasị ala gọọmenti nyere ụfọdụ ndị chọrọ ịrụ ihe na mpaghara ahụ, mana ụfọdụ ndị ntorobịa bi na mpaghara ebe ahụ jiri aka ike wee kpara ha bụ ala, ma na-eresi ya ndị mmadụ aka ha dị ọcha, bụkwa nke ọ na-eme ha resichaa mmadụ, ha esikwa n'azụ resi ya onye ọzọ, nara ego. Ọ kọwàrà na gọọmenti akwụchaala ndị obodo ahụ ego niile kwesiri na a ga-akwụ ha, nke mere na o nweghịzị onye ọbụla n'ime ha kwesiri maọbụ nwee ikike ịkpara maọbụ itinye aka n'ala ahụ ọzọ, belụsọ̀ onye ahụ o nwètèrè nkwado gọọmenti.

Ọ dụkwazịrị ndị ọbụla na-arụ ihe aka na ntị ka ha buru ụzọ nweta ikike nà akwụkwọ nkwàdó n'aka gọọmenti tupu ha ebido ime nke ahụ, n'ihi na ụlọ ọbụla a rụrụ n'ebe ekwesighị ekwesi maọbụ n'ala gọọmenti n'enweteghị nkwadó ga-apụ̀rịrị.

Ọ kọwara na ebumnobi ha jiri kutusie ụlọ ahụ abụghị ka ha megide maọbụ mekpàá ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị otu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga-agbasokwa aka ahụ na-emekwa nke ha otu ha siri ọbụla ha chọọ n'ebe ndị ọzọ ekwesighị ekwesi maọbụ ebe iwu akwadòghị, bụkwá nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nàkwà nke megidere ezi ebumnobi aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo bù n'obi, ma bụrụkwa ihe ịdọghachi aka elekere azụ nye ọrụ mmepe ọ na-abagide na seeti ahụ.