Anambra Nwèrè Ndị Nkụzi Ma Nke Ekwe Na-akụ —Soludo

Oct 21, 2022 - 10:47
 0
Anambra Nwèrè Ndị Nkụzi Ma Nke Ekwe Na-akụ —Soludo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo etoola ndị nkụzi steeti Anambra dịka ndị ma nke ekwe na-akụ ma bụrụkwa ọkaibe na ngalaba nkụzi ha dị icheiche.

Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a oge ọ na-anabata ndị nkụzi ahụ nwetere nturuùgò n'onyinye nkwanyeùgwù ahụ a na-enye ndị nkụzi kacha mee nke ọma n'ala Nigeria n'ime afọ ọbụla, bụ nke a maara dịka ‘Presidential Award’ maọbụ ‘President’s Teachers, Schools Excellence Award’.

Ọ dị ncheta na ndị ise sitere ụlọakwụkwọ dị icheiche na steeti Anambra sò na ndị nwetara nturuùgò na nkwanyeùgwù ahụ na ya bụ mmemme nke n'afọ a, bụ nke weere ọnọdụ na nsonso a.

N'okwu ya oge ọ na-anabata ndị nkụzi ahụ n'ebe obibi Gọvanọ dị n'Amawbia, Gọvanọ Soludo kọwàrà ndị nkụzi dịka ndị bara oké uru ma dịkwa oke mkpa n'obodo ọbụla, n'ihi na a na-esi n'ụdị ndị nkụzi obodo ọbụla nwere wee mara ọdịnihu obodo ahụ.

O kwukwàrà na ọrụ nkụzi bụ ọrụ e ji mmasị, ọnụ̀nụ̀okụ n'obi na ịdị uchu were arụ, ọbụna dịka ọ kọwàrà ndị nkụzi ahụ tuuru ugo n'asọmpi ahụ nke afọ a dịka ndị gosipụtagoro n'ezie na ha bụ̀ ọkaibe na ejiamaatụ̀ ngalaba ha dị icheiche, ọbụna dịka ọ dụrụ ha ka ha jisikwa ike n'ọrụ, na-adị uchu karịa, ka gharakwa ịda mbà.

Na ntụnye nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ na steeti ahụ, bụ Ọkammụta Ngozi Chuma-Udeh mere ka a mara na Anambra bụ steeti e ji ama atụ n'ihe gbasaara agụmakwụkwọ n'ala Nigeria nà ná mpaghara ụwa gbaa gburugburu, ebe ndị nkụzi steeti ahụ na ụmụakwụkwọ ha gosipụtakwàrà ọtụtụ ugboro na ha bụ ọkaibe, site na na nturuùgò dị icheiche ha nwetegoro n'asọmpi dị icheiche, ma n'ala Nigeria, na n'ogoogo mba ụwa.

Ọ dụkwazịrị ndị nkụzi ndị ọzọ ka ha ǹòmie ndị a nwetara nturuùgò ahụ site n'ịgbasi mbọ ike na ịdịwanye uchu n'ọrụ ha karịa ka ha dị na mbụ.
 
Ndị nkụzi ahụ tuuru ugo gụnyèrè Chukwunedu Sabina Ijeoma nke ụlọakwụkwọ ‘Abbott Girls Secondary School, Ihiala’; Ugokwe Marilyn Uchenna nke ụlọakwụkwọ ‘Susu College, Nkpor’; Ifetike Chekwube Hope nke ụlọakwụkwọ ‘Government Technical College, Onitsha’; Onyemaechi Pius Chiedu nke ụlọakwụkwọ ‘Federal Government Girls College Nkwelle-Ezunaka’ tinyéré ụlọakwụkwọ ‘Nigerian Science and Technical College, Nnewi’.

Ndị nkụzi a na ụlọakwụkwọ a bụ ndị nwetara nturuùgò na ngalaba dị icheiche, ma bụrụkwa ndị e nyekwàrà ọtụtụ ihe nrite dị icheiche, dịka, ụgbọala, ọgbatumtum, igwe na-enye ọkụ, na ihe nrite ndị ọzọ site n'aka ndị na-achịkọ̀ba asọmpi ahụ.

N'ịtụkwàsà n'elu nke ahụ, Gọvanọ Soludo nyekwazị̀rị̀ onye ọbụla nile ha otu nde naịra, iji sị ha jisie ike.

Mmemme inabata ndị nkụzi ahụ dọtàkwàrà ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche na steeti Anambra, nke Kọmishọna na-ahụ maka Omenala, Maazị Don Onyenji; Onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ, Maazị Ernest Ezeajughi; tinyéré odeakwụkwọ mgbasaozi nye Gọvanọ, Maazị Christian Aburime, na ụfọdụ ndị ọzọ.

What's Your Reaction?

like

dislike

love

funny

angry

sad

wow

Izunna Okafor Izunna Okafor is an award-winning Nigerian novelist, poet, journalist, essayist, editor, translator, publicist, Igbo language activist and administrator who hails from Ebenator in Nnewi South Local Government Area of Anambra State, Nigeria. He writes perfectly in English and Igbo languages, and has published several books in both languages. He has received over 25 awards, and has over 2000 articles published online, both nationally and internationally, cutting across creative writing and journalism. See his full profile at: https://9jabooks.com/profile/484