Anambra Ga-adịrịrị Ọcha —Soludo

Anambra Ga-adịrịrị Ọcha —Soludo

Izunna Okafor dere akụkọ a

Ọchịchị steeti Anambra akpọkuola ụmụafọ steeti ahụ ka ha malite ịgbaso ibi ndụ adịmọcha na idebe gburugburu ebe obibi ha ọcha, iji kwalite ezi ọnọdụ ahụike bụ ịgba na ọnọdụ gburugburu tọrọ ụtọ n'anya.

Aka na-achị steeti ahụ, bụ gọvanọ Chukwuma Soludo bụ ya nyere ndụmọdụ n'okwu ya oge ọ na-esonye n'ọrụ mkpocha na nzacha ahụ a na-eme na steeti Anambra n'ụbọchị Satọdee ikpeazụ nke ọnwa ọbụla, nke ọnwa Julaị gwụrụ agwụ.

Gọvanọ Soludo, onye soro wee kpoo ahịhịa ụbọchị ahụ n'ahịa Eke Awka, kpọpụtasịrị̀ mbọ dị icheiche gọọmentị steeti gbagoro iji kwalite ezi ọnọdụ adịmọcha gburugburu steeti ahụ, ma dụọ ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha nyere gọọmenti aka na mbọ ahụ ọ na-agba, site n'ime ihe nke dịịrị ha, na ịdị na-esonyesi ike n'ọrụ mkpocha na nzacha omenọnwa ahụ. O kwukwàrà na a ga-ebidozị ịga n'ụlọ n'ụlọ na-eburu ahịhịa na atịtị na steeti ahụ, n'ihi usoro ọhụrụ ahụ gọọmentị wepụtara a ga-esi na-ekpofu ahịhịa.

N'okwu nke ya n'ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka gburugburu na steeti ahụ, bụ Maazị Felix Odimegwu kèlèrè Gọvanọ Soludo maka nkwàdó ya n'idebe ọnọdụ gburugburu ahụ ọcha; ma dọkwazie ụmụafọ steeti ahụ aka na ntị megide iji ahịhịa asuụ̀chisi ọ̀wammiri na ikpofu ahịhịa n'ụzọ ekwesighị ekwesi, maka na onye ọbụla a hụziere maọbụ jide ka ọ na-eme ihe dị otu ahụ ga-abụ onye a ga-eji usoro iwu wee nyụchaa anya.

N'ozi ekele ya, onyeisioche ahịa Eke Awka, bụ Maazị Jude Agummadụ kèlèrè Gọvanọ Soludo ma ọchịchị steeti Anambra n'ụzọ pụrụ iche maka ịmalite ya bụ ọrụ mkpocha na nzacha n'ahịa ahụ, ma kwe nkwà na ndịisi ọchịchị ahịa ahụ na ndị na-azụ ahịa n'ebe ahụ ga-enye ya nkwàdó n'ụzọ pụrụ iche, ọkachasị n'ịkwàlite ezi ọnọdụ gburugburu n'ebe ahụ.

Ụfọdụ ndị dị icheiche sonyere nà mmemme ahụ gụnyèrè Osote aka na-achị steeti Anambra, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim; onyeisi ndị ọrụ nye Gọvanọ, bụ Maazị Ernest Ezeajughi, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.